Ntaramahụhụ nye ụmụaka anaghị enyere ha aka

Aha onyonyo, Ịpịa ụtarị na ntaramahụhụ dị icheiche bụ ụzọ esi adọ ụmụaka aka na ntị ma ha mehie

Ọtụ nwantakịrị nwaakwụkwọ nwụrụ dịka onye nkuzi ya nyere ya ntaramahụhụ n'ụlọakwụkwọ ya dị n'Imo steeti.

Chimezie Elekwachi bụ dibia na-ahụ maka akọ n'uche mmadụ gwara BBC na ntaramahụhụ a na-enye ụmụakwụkwo na-eme ka ụbụrụ ha kpọchie.

Ndị ọnụ na-erụ n'okwu ekwuola na e nwere ụzọ ọzọ a ga-esi kuziere nwata ihe maọbụ dọọ ya aka na ntị ma o mehie na-abụghị site na ịta ya ahụhụ.