You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndịagha Naịjirịa ekposaala ogige IPOB/ESN n'Imo steeti, nweta ozu ndị mmadụ
Ndịagha Naịjirịa ekwuola na Ngalaba 82 ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ekposala otu nnukwu ogige nke otu ndị na-eyi ọha egwu a ma ama dịka ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) na ndị otu ha, Eastern Security Network (ESN), dị n'Imo steeti.
N'ozi ha wepụtara n'akara soshal midịa ha, ka ha kwuru na ọrụ ahụ, nke e mere n'ụbọchị 24 Eprel 2026 na mpaghara Ubaha Orsu nke okpuruọchịchị Orsu, bụ otu n'ime ọrụ nnyocha na nchọcha nke ebumnuche ya bụ ịkwatu ebe ndị IPOB/ESN zoro ezo na mpaghara ahụ ma chọta ozu ndị ọrụ ndịagha Naịjirịa abụọ e gburu egbu.
Cheta na ndị omekome IPOB/ESN tọọrọ ma gbuo Maazị Warrant Officer Linus Musa Audu na Private Gloria Mathew, mgbe ha na-aga agbamakwụkwọ ọdịnala ha n'ọnwa Mee 2022.
Dịka ozi ndịagha si kwuo, ndịagha ahụ kposara ogige ahụ gara n'ihu n'ebe a na-enyo enyo na ọ bụ ebe ndị IPOB/ESN zoro ezo mgbe ndị omekome ji ngwaagha ma wakpoo ha.
"Ndịagha ahụ lụsoro ndị ahụ na-eyi ọha egwu ọgụ nke ọma, nke mere ka ndị omekome ahụ gbaa ọsọ. Nzute ahụ kpughere mpụ nke ndị otu ahụ na-aga n'ihu na-awakpo ụmụafọ Naịjirịa ndị aka ha dị ọcha na ndị ọrụ nchekwa," ka ozi ndịagha kwuru.
Mgbe e mechara nkea, ndịagha nyochachara ebe ahụ nke ọma ma chọpụta ebe a na-enyo enyo na o nwere ozu ndị ahụ ndị omekome ahụ gburu egbu oge gara aga.
Ndịagha gara n'ihu jiri nlezianya gwupụta ili ndị ahụ ma chọta ozu mmadụ nke ndị omekome ahụ liri n'ime ha.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a
Ụlọọrụ ndịagha kọwakwara na ha etinyela ozu ndị ahụ e weghachitere n'ebe a ga-eme nnyocha zuru ezu iji achọpụta ihe gburu ndị ahụ na nnoycha 'DNA', iji chọpụta njirimara ha.
Ha kwuru na a na-agbakwa mbọ ịhụ na ndịagha na ezinụlọ ndịagha ahụ nwụrụ anwụ rụkọrọ ọrụ iji hụ na e mere chọpụta ahụ nke ọma ma nyekwa ndị nwụrụ anwụ olili kwesịrị ekwesị maka mbọ ha gbara.
N'agbakwunye, ụlọọrụ ndịagha kwuru na ọrụ a abụghị naanị imezu nkwa ndịagha Naịjirịa iji hụ na ndịagha nwụrụ anwụ nwetara ikpe ziri ezi kamakwa ọ na-egosi mmebi na-aga n'ihu nke a na-ebibi otu IPOB/ESN na akụrụngwa ha n'ofe ndịda ọwụwa anyanwụ.
E kwuru na nchọpụta ili ndị e gburu egbu n'ime ogige ha na-ekpughekwa ajọ arụ nke otu ahụ na-akpa megide ndụ mmadụ.
'Mother Valley', 'Camp Gbadoanya' na ogige ESN ndị ọzọ ndịagha Naịjirịa kposara n'Anambra na Imo Steeti
Ndịagha Naịjirịa kwuru na ha ekposaala ogige dị iche iche nke ndị otu chọrọ nwereonwe na Naịjirịa bụ Indigenous People of Biafra (IPOB) na ndị ojiegbe na-eso ha bụ Eastern Security Network (ESN) dị n'Anambra nakwa Imo Steeti.
N'ozi ha wepụtara n'akara soshal midia X, ndịagha kwuru na ha mere nke a n'ọrụ nchekwa ha kpọrọ 'Operation Sanity' na-aga n'ihu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
O zi ahụ kwuru na wakporo ogige IPOB dị n'Orsumoghu na Ihiala n'ụbọchị atọ na anọ nke ọnwa Maachị 2026 ma kposaa ha.
Ndịagha kwuru na ụfọdụ ihe ndị ha kpachiri na mwakpo ahụ gụnyere egbe 'pump action', egbe akpụrụakpụ, na ọtụtụ egbe na mgbọ ha, mma oge nakwa ngwa egwu, akwụkwọ ego Biafra, akụrụngwa ogbunigwe, ọkọlọtọ Biafra, ọtụtụ batịrị ụgbọala. Igwe e ji egwu ala na nke e ji agbakọta igwe ọkụ nakwa ihe ndị ọzọ.
Mana ndịagha ekwughi ma o nwere onye n'ime ndị otu a ha jidere maọbụ gbuo na mwakpo ahụ.
Ihe anyị hụrụ n'ogige 'mother valley'
N'otu aka ahụ, ndị ọrụ nchekwa pụrụiche gụnyere ndịagha, ndị uweojii na ndị 'Civil Defence' a kpọrọ 'UDO KA (OPUK)' wakporo ogige ndị otu IPOB/ESN dị n'olulu 'Mother Valley, Nkwere nke mpaghara Anambra Steeti.
N'ozi ha wepụtara n'akara soshal midia X n'ụbọchị Fraide 27 Febụwarị 2026, ndịagha kwuru na ha na ndị ojiegbe ahụ ji ogbunigwe na egbe akpụrụakpụ kwakọrịtara mgbọ tupu ha gbagbuo otu onye n'ime ha, ebe ndị ọzọ bu mgbọ egbe n'ahụ gbaa ọsọ.
Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na ha nwetara ọtụtụ ngwaọgụ gụnyere egbe 'pump action' abụọ, mgbọ egbe na ihe ndị ọzọ, ebe ha gara n'ihu mebie ihe ogige ahụ.
N'otu aka ahụ, ndị nchekwa a nwuchiri ndị Ipob abụọ bụ ndị na-agbara ndị otu IPOB/ESN ama maka njem etu ndịagha si akpagharị n'ogige ahụ.
Mgbe ndịagha malitere ọrụ mkposa ahụ
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ewerela ọnọdụ n'obodo Orsumoghu nakwa obodo ndị ọzọ gbara ya gburu gburu dị n'Imo Steeti.
Ndị ọrụ nchekwa a gụnyere ndịagha 34 artillary Bridgade Obinze, ndị uweojii (ngalaba Tiger Base), ndị DSS, ndị Civil Defence nakwa ndị nchekwa ọdịnala nọ n'obodo a ịrụ ọrụ ha kpọrọ 'nzacha na mkpocha' ogige ndị ojiegbe ESN dị n'obodo Orsumoghu.
Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri etu ndị ọrụ nchekwa si akpagharị n'ebe dị iche iche n'Orsumoghu ebe ndị ojiegbe kpachiburu n'oge gara aga.
Dịka ha na-aga ka ha na ndị ojiegbe a na-akwakọrịta mgbọ. N'otu aka ahụ ha na-abọpụta ọfụdọ ogbunigwe ndị e liri n'okporoụzọ.
Ụfọdụ ebe ndị ha gara gụnyere Orsuihiteukwa, Ụlọụka St.Marys nke Katọlik, ahịa Afọ dị n'Orsumoghu, ụfọdụ mpaghara olulu a kpọrọ 'mother valley', Umunoha nakwa Orlu dgz.
Ihe onyonyo otu onye a kpọrọ Ijele so ha n'ọrụ ahụ na-ekesa na soshal midia gosiri etu ha si eme n'ọrụ ahụ.
BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti ịmata banyere ọrụ nchekwa ndị otu ha na ndị ọzọ na-arụ mana ọ zaghi.
Onye ntaakụkọ nọ n'Imo Steeti na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndịagha na ndị ọrụ nchekwa ọzọ nọ n'Orsumoghu ugbua na-arụ ọrụ.
O kwuru na onyeisi ndị uweojii ngalaba 'Tiger Base' n'Imo Steeti bụ Oladimeji Odeyeyiwa gwara ya na ụfọdụ ndị ọrụ ha nọ n'ọrụ n'obodo Orsumoghu.
Ola ekwughi kpọmkwem mgbe ha malitere ọrụ nchekwa a n'obodo Orsumoghu mana site n'ihe a hụrụ nakwa ihe akụkọ na-ekwu, ndịagha malitere ọrụ a n'ime izuụka abụọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2026.
BBC Igbo kpọtụụrụ ndị obodo Orsumoghu ịnụta n'ọnụ banyere mbata na ọrụ nchekwa a na-aga n'ihu n'obodo ha.
"Anyị ma maka ọrụ ndị nchekwa na-arụ n'Orsumoghu"
Otu onye obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị ọrụ nchekwa jikọtara aka na-arụ ọrụ n'obodo ha.
Ọ sị na "ụjọ adịghị ndị obodo anyị n'ọrụ ndị a na-arụ, nchekwa adịla n'ọtụtụ ebe n'obodo kama e nwere ụfọdụ ebe ndị fọtụrụ, ọ bụ n'ihi nke a mere ha jiri bịa ịhụ na ha kpochapụrụ ebe ndị a.
Ebe ndị a lekwasịrị anya bụ okeala dị n'Orsumoghu na Anambra Steeti."
O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ amaghị banyere ọrụ a maka na ọ bụ ọrụ nchekwa pụrụiche ma zoo ezo.
Nke a abụghị mbụ ndị ọrụ nchekwa na-awakpo ogige dị iche iche ebe ndị ojiegbe dị n'Orsumoghu nakwa gburu gburu ya.
Kamgbe ihe ruru afọ ise gara aga rute ugbua, ha na-abanye n'ogige ndị ojiegbe e cheere bụ ndị otu IPOB/ESN dị n'ọtụtụ obodo dị n'Imo steeti kwa mgbe kwa mgbe.