You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Emeghị m nrụrụaka n'ụdị ọbụla oge m bụ mịnịsta – Diezani Alison-Madueke
Diezani Alison- Madueke bụbu mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi na Naịjirịa agọọla na ya emeghị nrụrụaka ọbụla.
Alison-Madueke gwara ụlọikpe Southwark Crown Court n'ụbọchị Mọnde 13 Eprel, na ya gbara mbọ igbochi ma megide nrụrụaka n'agbanyeghị na nrụrụaka nwere mgbọrọgwụ na Naịjirịa kemgbe ha nọ n'aka ọchịchị mba Briten.
Cheta na e boro Alison-Madueke ebubo nrụrụaka dị iche iche nke gụnyere iji ego dị nde pounds abụọ (£2m) o zuru ezu zụọ ihe n'ụlọahịa Harrods nakwa iji nde pound anọ na isii (£4.6m) dozei ụlọ abụọ dị na Lọndọn nakwa Buckinghamshire.
N'okwu ya "Enweghị oge ọbụla m rịọrọ maọbụ nara ego aka azụ n'ụdị ọbụla maọbụ metọọ ụlọọrụ m oge m nọ n'okwa dịka mịnịsta, agbara m mbọ ime ihe ziri ezi oge niile".
O kwuru na ụlọọrụ NNPC kwụghachiri ego niile e mefuru n'isi ya ma kwuo na e nwere ụlọọrụ a hiwere na Lọndọn hụrụ maka njem ya niile maka na ọnọdụ ndekọ ego NNPC nwere etu ọ dị oge ahụ.
Ụlọikpe Lọndọn ekwuola na Diezani Alison-Madueke naara aka azụ ma mee nrụrụaka dị iche iche
Ụlọikpe dị na Lọndọn ekwuola na Diezani Alison-Madueke bụbu mịnịsta mmanụ agbidi na Naịjirịa, naara aka azụ ma mee nrụrụaka dị iche iche nke gụnyere ịzụ ụlọ n'UK.
Ụlọikpe ahụ boro Madueke ebubo iji ego o nwetara site na nrụrụaka zụọ ụlọ na m aghara Buckinghamshire ma zụọ ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị oke ọnụahịa na Harrods.
Ụlọikpe Southwark Crown kwuru etu Alison-Maduke bụ minister mmanụ agbidi na Naịjirịa site na 2010 ruo 2015, si biri n'UK ma nweta ndị ọrụ dị iche iche nke ọ bụ ego o nwetara na nrụrụaka ka o ji akwụ ha ọgwụ.
Alison-Madueke gọnarịrị ebubo nrụrụaka ndị a niile ụlọikpe boro ya ma kwuo na aka ya dị ọcha.
Ikpe ya ga-aga n'ihu izuụka iri na abụọ.
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara Diezani Alison-Madueke
A kpụpụla Diezani Madueke n'ụlọikpe dị na London maka ebubo iri ngarị
A kpụpụla onye bụbu Minista mmanụ agbidi na Naịjirịa bụ Diezani Alison-Madueke n'ụlọikpe Southwark Crown dị na Lọndọn, mba United Kingdom maka nnụrụ ikpe ya n'ebubo iri ngarị.
Ikpe a bụ nke a tụrụ anya ịmalite nke ọma n'ụbọchị 26 Jenụwarị 2026.
Alison-Madueke bụ Minista nwaanyị mbụ hụrụ maka mmanụ agbidi site n'afọ 2010 ruo 2015.
Ọ bụkwa nwaanyị mbụ bụ Onyeisioche otu jikọtara mba ndị na-ebupụ mmanụ agbidi bụ Organisation of Petroleum Exporting Countries (OPEC).
Madueke dị afọ 65 bụ onye e buuru ụzọ nwuchie na Lọndọn n'ọnwa Ọktoba 2015, mana e mechara gbapụta ya. Ọ gọnarịkwara ebubo isii e boro ya.
N'afọ 2023 ka ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na mba United Kingdom boro ya ebubo iri ngarị n'agbata afọ 2011 na 2015.
Ụlọọrụ ahụ sịrị "na ha na-enyo enyo na Diezani Alison-Madueke ji ike mee ihe n'ụzọ na-ezighị ezi na Naịjirịa ma nata onyinye ego maka inye ọrụ ruru nde paụnd.
Dịka ha si kwuo, Diezani ritere uru otu narị puku euro £100,000 ($134,000), ụgbọala ọkwụọtọ ekele eze, iji ụgbọelu nkeonwe eme njem nakwa inwe ọtụtụ ihe onwunwe na Lọndọn nakwa ihe ndị ọzọ.
A na-atụ anya na ikpe ya a ga-amalite n'ụbọchị Mọnde 26 Jenụwarị ga-erụ izuụka iri maọbụ iri na abụọ.
Mmadụ abụọ ndị ọzọ a kpọrọ aha n'ikpe a bụ Doye Agama, onye nke bịara n'ụlọikpe site n'ihe oyonyoo nakwa Olatimbo Ayinde, onye nke bịara n'ụlọikpe na mmadụ.