Ụmụaka ji aka ha rụpụta 'smart car' n'Owere

Aha onyonyo, Ụmụaka ji aka ha rụpụta 'smart car' n'Owere
Ụmụaka ji aka ha rụpụta 'smart car' n'Owere
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Editor
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Ụmụaka ejirila aka ha rụpụta ụgbọala a kpọrọ 'smart car' site na mgbazi Maazị Chidi Duru, onye hiwere ụlọ ọmụmụ Codeant Technology Hub.

Maazị Duru bụ onye na-akụziri ụmụaka etu ha na kọmputa nwereike isi na-akparịtaụka, bụ nke a kpọrọ 'Coding and Robotics' n'asụsụ Bekee.

Ọ sịrị na ndị nne na nna na-akpọta ụmụ ha ndị na-amaghị ihe ọbụla gbasara nkanụzụ, mana n'ime obere oge, ha amalite ịghọta ya ma bido iji ya arụpụta ihe dị iche iche.

"Ihe a bụ 'smart car', ụmụaka na-ede 'program' n'ime ya. Ya na ụmụaka na-akparịta ụka. Ha sị ya bịa, ọ bịa".

"Dịka nke a, ụmụaka dechaa 'program' n'ime ya, ha were 'remote' a na-achịkọta ya. Ha chọọ ka ọ gbaa ọsọ, ka ọ gaa ihu maọbụ laa azụ, ihe ọbụla ha chọrọ ka o mee, ka ọ ga-eme."

Otu nwaakwụkwọ na-anara ọzụzụ n'ụlọ ọmụmụ Codeant Technology Hub bụ Anderson Chijindu kwuru na ya na-amụ etu e si ekepụta ma hazie websaịtị.

Chijindu sịrị: "ihe m na-amụta ebe a bụ etu e si arụ ihe a na-akpọ 'website'".

"Ihe mere o ji na-enye m obi aṅụrị bụ na ọ na-enye m obiụtọ ịhụ na ihe ọbụla m dere na-egosi m ihe mara mma ma ya pụta."

Maazị Chidi Duru na-akụzikwara ụmụaka ndị nwere nkwarụ etu e si agwa kọmpụta okwu iji mepụta ihe dị iche iche bụ 'programming'.

Chidi Duru kwuru na ya na-eme nke a site n'enyemaka onyenkụzi ndị ogbi, bụ onye na-enyere ya aka igosi ụmụakwụkwọ ndị ahụ ihe ọ na-akụzi.

"O nwere otu ụlọakwụkwọ m gara n'Imo Steeti ma chọpụta na ụmụakwụkwọ ha dị ka ụmụakwụkwọ ndị ọzọ, kama ihe dị iche bụ na ha anaghị ekwu okwu. Ha maara ihe dịka ụmụaka ndị ọzọ".

"Nke a mere m jiri gwa onyenkụzi ha na ọ ga-amasị m ịbịa kụziere ha ihe dịka m si akụziri ụmụaka ndị ọzọ. Ọ bụrụ na m na-akụziri ha, n'ihi na o nweghị asụsụ Bekee maọbụ asụsụ Igbo m ga-eji kọwaara ha ihe dị aṅaa, mgbe ụfọdụ ana m agba egwu maọbụ mee ejije iji kọwaa ihe m chọrọ ịkụziri ha nke ọma. Mana enwere m onyenkụzi ndị ogbi mụ na ya na-arụkọ. Ọ na-abụ m na-akụzi, ọ na-egosi ha etu ha nwereike isi ghọta ya," ka ọ kọwara.

"Ihe a bụ 'smart car', ụmụaka na-ede 'program' n'ime ya. Ya na ụmụaka na-akparịta ụka. Ha sị ya bịa, ọ bịa".

Maazị Chidi Duru gụrụ ihe ọmụmụ Microbiology na mahadum Imo State University dị n'Owere, ma n'ihi ụkọ ọrụ, ọ gara ọzụzụ dị iche iche gbasara iji kọmputa eme ihe.

"Ọ bụ etu ahụ ka m siri malite ime ihe a na-akpọ 'coding' nke bụ ịgwa kọmputa okwu site n'ihe e dere ede. Mụ na kọmputa amalite ịkparịta ụka. Ana m ede asụsụ kọmputa pụrụ ịghọta."

Ọ sịrị na mmasị o nwere n'ebe ụmụaka nọ kpaliri mmụọ ya ịga n'ụlọakwụkwọ dị iche iche iji nweta ohere ịkụziri ha kọmputa.

"Ụfọdụ ụlọakwụkwọ jụrụ, ebe ndị ọzọ nabatara m. Ọ bụ etu ahụ ka m siri mata ụlọakwụkwọ dị iche iche, ma dee akwụkwọ gbasara usoro nwata nwereike isi mụta kọmputa malite na klaasị nke mbụ ruo mgbe ọ gụchara akwụkwọ sekọndịrị."

O kwuru na ya kpọbatara ndị mmadụ, na-akụziri ha etu mmadụ na kọmputa pụrụ isi nwee mkparịtaụka, ma site n'ịkụziri ha, o nwezie ọtụtụ ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ.

Maazị Chidi Duru kwuru na ọtụtụ ụlọakwụkwọ na-akụzi 'Coding' n'Imo Steeti, mana ọ bụ ya na ndị nkụzi ya na-emere ha ya.

O nyere ndị nne na nna ndụmọdụ ka ha mee ka ụmụ ha sonye n'ọmụmụ nkanụzụ, maka na ọ bụrụ ụmụakwụkwọ ndị nọ na sekọndịrị ukwu, ọ ga-enyere ha aka n'ihe ọmụmụ Fiziks maọbụ Kemistrị, ma nyekwara ndị nke nọ na klaasị obere aka ime nke ọma n'ọmụmụ Mgbakọ na Mwepụ site na 'coding' a na-akụziri ha.