Akụkọ dị mkpa - Maachị 23, 2026

Aha onyonyo, Akụkọ dị mkpa - Maachị 23, 2026
Akụkọ dị mkpa - Maachị 23, 2026

Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:

  • Ndị uweojii n'Enugwu Steeti anwụchiela nwaokoroọbịa dị afọ iri abụọ na anọ (24) aha ya bụ Desmond Ugwu maka idina nwaanyị dị ime n'ike, ma gbaakwa mbọ igbu ya.
  • N'ozi o wepụtara n'ụbọchị Sọnde 22 Maachị 2026, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru na nke a mere n'obodo Affa dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Udi n'Enugwu Steeti.
  • Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Oluremi Tinubu akatọọla mmetọ e metọrọ ụmụnwaanyị n'obodo Ozoro dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Isoko North na Delta Steeti, ma kpee ekpere ka ụmụnwaanyị ọnọdụ ahụ metụtara nata ọgwụgwọ.
  • N'ọzọ yiri ya, Obieze Ozoro akatọọla omume ike e mesoro ụmụnwaanyị n'obodo ahụ, dịka ndị uweojii kwuru na ha anwụchiela mmadụ iri na ise a na-enyo enyo na ha dinara ụmụnwaanyị n'ike.

Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.

Foto e dere Akụkọ dị mkpa
Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo na Whatsapp
BBC IGBO
Nkọwa foto, Whatsapp Chanelu BBC IGBO