Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla mmadụ isii ụlọikpe maka ebubo ịkwatu ọchịchị Onyeisiala Tinubu

Kedụ ndịagha kpara nkata ịkwatu ọchịchị Tinubu, gịnị ka a ga-eme ha?

Ebe foto si, @DHQNigeria

Nkọwa foto, Kedụ ndịagha kpara nkata ịkwatu ọchịchị Tinubu, gịnị ka a ga-eme ha?
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọọmenti Naịjirịa ebuola mmadụ isii gụnyere ọchịagha lara ezumike nka na otu onye ọkwa ya dị elu n'ụlọọrụ ndị uweojii Naịjirịa, ebubo ịtụ atụmatụ ịkwatu ọchịchị Onyeisiala Bola Tinubu n'afọ gara aga.

E kwuru na ọ bụ Ọkaiwu Ukwu nke Naịjirịa tinyere akwụkwọ ikpe ahụ n'Ụlọikpe Ukwu dị n'isi obodo Abuja bụ ebe ndị a na-ebo ebubo ga-apụta n'ihu Ọkaikpe Joyce Abdulmalik n'ụbọchị Wenezde 22 Eprel 2026, iji zara ọnụ ha n'ebubo iri na atọ, e boro ha.

N'ime ndị ahụ e boro ebubo gụnyere Ọchịagha Mohammed Gana lara ezumike, Kaptịn Erasmus Victor lara ezumike nka, Ahmed Ibrahim, Zekeri Umoru, Bukar Goni, Abdulkadir Sani nakwa Timipre Sylva bụbu obere minista hụrụ maka mmanụ agbịdị Naịjirịa, bụ onye e kwuru na amabeghị ebe ọ nọ ugbua, dịka onye nke asaa.

Cheta na akụkọ banyere atụmatụ ịkwatu ọchịchị Onyeisiala Tinubu fesasịrị n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2025, pụtara ihe mgbe gọọmenti kagburu emume ndịagha na-eme maka ncheta afọ iri isii na ise nke Naịjirịa nnwere onwe ya.

Dịka akwụkwọ ikpe ahụ si kwuo, ndị a na-ebo ebubo mmadụ isii ahụ, bụ ndị na-ekwubeghị okwu gbasara ebubo ndị ahụ, "gbara izu megide Naịjirịa site na ịtụ atụmatụ iji kwatuo ọchịchị Onyeisiala Tinubu.

Akwụkwọ ikpe ahụ kwukwara na ọ bụ Ọchịagha Mohammed Alhassan Ma'aji nọ n'isi atụmatụ ahụ tupu e jide ya na ndị otu ya.

Ndị ọkaiwu kwukwara na ndị e boro ebubo maara maka nkata Ọchịagha Ma'aji na-akpa, mana ha ekwupụtaghị ya.

Gịnị ga-eme ndịagha kpara nkata ịkwatu ọchịchị Onyeisiala Tinubu?

N'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba 2025, a kagburu emume dị iche iche e ji echeta ụbọchị nkwụrụ na nke onwe Naịjirịa dịka Onyeisiala Tinubu gbasaara ndị Naịjirịa ozi site n'ihe onyonyoo.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Otu akwụkwọ akụkọ Naịjirịa bipụtara ozi oge ahụ ma kwuo na ụfọdụ ndịagha kpara nkata ịkwatu ọchịchị Tinubu n'ụbọchị a ga-echeta afọ iri isii na ise Naịjirịa kwụụrụ onwe ya.

Ha kwuru na ọ bụ nke ahụ kpatara gọọmenti jiri kagbuo emume ndị a na-eme n'ụbọchị ncheta nkwụrụ na nke onwe Naịjirịa.

Akwụkwọ akụkọ ahụ gakwara n'ihu kwuo na a nwuchiela ụfọdụ n'ime ndịagha ahụ maka ịkpa nkata nkwatu ọchịchị.

Ka e mesịrị, akụkọ fesara ebe niile na a chụọla ndịagha iri na isii gụnyere ndị ji ọkwa Kaptịn nakwa ndị Brigadier General.

Akụkọ ahụ kwuru na a kpụgara ndịagha ahụ a chụrụ n'ọrụ na ngalaba Defence Intelligence Agency n'ihi ebubo inwe nzukọ nzuzo, iji kpaa maka ụzọ ha ga-esi kwatuo gọọmenti Naịjirịa.

Mana ka ọ dị, isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa wepụtara ozi n'ụbọchị Satọde 18 Ọktoba 2025 ma kwuo na ọ bụghị eziokwu na a kagburu ihe omume ndị e ji echeta afọ iri isii na ise Naịjirịa kwụụrụ onwe ya n'ihi mbọ ụfọdụ ndịagha gbara ịkwatu ọchịchị Tinubu.

Ha kwuru na ihe mere e jiri kagbuo emume ncheta ụbọchị nkwụrụ na nke onwe Naịjirịa bụ maka na Onyeisiala Tinubu nwere nzukọ dị oke mkpa ọ chọrọ ịga na mba ofesi.

Ndịagha kwukwara na ihe ọzọ mere e jiri kagbuo emume ncheta ụbọchị nkwụrụ na nke onwe Naịjirịa bụ iji nye ndịagha ohere ịga n'ihu n'ọgụ ha na-alụ megide ndị na-eyi ndụ egwu, bụ nke bidoro ịmịta mkpụrụ.

Mana ka obere oge gara, isi ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa wepụtara ozi ọzọ kwuo na ha amalitela inyocha ndịagha iri na isii.

Ozi ahụ Brigadier General Tukur Gusau wepụtara kwuru na nnyocha ahụ ga-agbakwasị ụkwụ n'usoro ọrụ ndịagha, ebe ha ga-emekwa ka ọhanaeze mara maka ihe niile ha chọpụtara.

Olee ndị bụ ndịagha 16 e boro ebubo nkwatu ọchịchị Naịjirịa?

N'ụbọchị Mọnde 26 Jenụwarị 2026 ka ndịagha Naịjirịa kwuru na ha emechaala nnyocha gbasara ndịagha iri na isii a nwuchiri n'ọnwa Ọktoba, 2025 maka ebubo ịkpa nkata nkwatu ọchịchị.

N'ozi Onyeisi ngalaba mgbasaozi n'ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa bụ Major General Samalia Uba wepụtara, o kwuru na ha emechaala nnyocha ma zigaara ndị "nna ha ukwu" ihe ndị ha chọpụtara dịka ọ dị n'usoro ọrụ ha.

Ka o sina dị, ọ kpọghị aha ndịagha iri na isii ahụ, mana ọnụ na-ekwuchitere ndịagha sị na a chọpụtala ndịagha nwere atụmatụ ịkwatu gọọmenti Tinubu, ma kwuo na omume ha adabaghị n'usoro ọrụ e ji mara ndịagha Naịjirịa.

"Nnyocha anyị mere achọpụtala ụfọdụ ndịagha a na-ebo ebubo na ha nwere atụmatụ ịkwatu gọọmenti, bụ nke na-adabaghị n'usoro ọrụ ndịagha Naịjirịa," ka ozi ahụ kwuru.

O kwuru na ha ga-eburu okwu ahụ gaa n'ụlọikpe ndịagha, bụ ebe ha ga-ahụ na e nyere ndịagha ahụ ntaramaahụhụ "dịka ọ dị n'iwu na usoro ụlọọrụ ndịagha."

Nkwatu ọchịchị dị iche iche ndịagha mere na Naịjirịa kemgbe 1960

Kemgbe Naịjirịa kwụụrụ onwe ya dika mba n'Afrịka n'ụbọchị 1 Ọktoba 1960, ndịagha akwatuola ọchịchị n'oge dị iche iche, ha gụnyere:

  • Nke mbụ mere n'ụbọchị 15 Jenụwarị 1966
  • Nke abụo bụ n'ụbọchị 29 Julaị 1966
  • Nke atọ bụ n'ụbọchị 29 Julaị 1975
  • Nke anọ bụ n'ụbọchị 13 Febụwarị 1976
  • Nke ise bụ n'ụbọchị 31 Disemba 1983
  • Nke isii bụ n'ụbọchị 27 Ọgọst 1985
  • Nke asaa bụ n'ụbọchị 22 Eprel 1990
  • Nke asatọ bụ n'ụbọchị 17 Nọvemba 1993