Ana m eji nsị na ureghure emepụta gaasị e ji esi nri - Ikechukwu Obioma
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Adline Okere
- Ndị mere akụkọ a, Editor
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Prince Ikechukwu Obioma bụ nwaokoroọbịa Imo Steeti na-eji nsị na ureghure dị iche iche arụpụta gaasị e ji esi nri nakwa ọkụ latrik.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Obioma kwuru na ụdị gaasị a ọ na-emepụta bụ nke a maara dịka 'bio gas' n'ihi na ọ bụ ihe oriri nakwa ureghure ndị e mepụtara n'ụlọ ka o ji arụpụta ya.
"Naanị ihe e ji emepụta 'bio gas' bụ ureghure ndị na-ere ure nke a na-akpọ 'bio degradable waste' n'asụsụ Bekee. Ureghure ndị a gụnyere nri ndị e rifọrọ erifọ, nsị mmadụ, nsị ụmụ anụmanụ dịka ehi na nsị ọkụkọ."
O kwuru na ya na-ejikwa mkpụrụosisi na akwụkwọ nri ndị nke na-ere ere, emepụta 'bio gas'.
Ikechukwu Obioma kọwara na onye gwuru olulu 'soakaway' n'ụlọ ya nwekwara ike ịtụgharị ya iji na-emepụta 'bio gas'.
"Anyị na-eme nke a kpọrọ 'conversion', anyị ga-egwunye igwe 'bio gas' n'akụkụ 'soakaway' ahụ, ma jikọta ha abụọ ọnụ, nke pụtara na o nweghịzi ihe ga-ejikọ onye ahụ na ikpopụ ureghure nsị [soakaway ahụ] n'ihi na ọ ga na-emepụtara ya gaasị site na nke ochie banye na nke ọhụrụ, ka ọ na-ahụ gaasị o ji esi nri.
Ọ kọwara na 'bio gas' nwere akụrụngwa na-azachapụ usi ọjọọ iji mee ka gaasị ga-esi na ya pụta dịrị ezigbo ọcha.
"O nwere ihe ndị Bekee na-akpọ 'filteration', 'bio gas' anyị na-arụpụta na-agabiga usoro nzacha dị iche iche, iji zapụ ihe ndị na-esi usi. Ọ bụrụ ma gị nụ usi 'bio gas', ị ga na-ajụ ma ọ bụkwa na nsị ka e si mepụta ya."
Dịka o Obioma siri kọwaa, uru ọzọ 'bio gas' bara bụ na a na-eji mmiri ya azụ ụmụ anụmanụ nakwa ụfọdụ akụmakụ, gụnyere akwụkwọ nri.
O kwukwara na 'bio gas' adịghị ka ikuku gaasị ndị ọzọ, n'ihi na ọ naghị agbawa dịka nke LPG.

Ikechukwu Obioma kwuru na 'bio gas' anaghị emetọ gburugburu maọbụ weta mgbanwe ihu igwe.
"Gbasara mgbanwe ihu igwe, 'bio gas' anaghị emetọ gburugburu, kama ọ na-emezi ala. Ọ ga-eme ị gaghị enwe unyi nke na-ebute ọrịa otoro".
"Ebe a chọpụtara 'bio gas' bụ na mba Ịndia, maka na o nwere oge ọrịa dị iche iche tiwapụrụ na mba ahụ. Oge e mere nnyocha, ọ bụrụ na nsị ha metọrọ ala nakwa mmiri ọṅụṅụ ha".
"Ọ bụzi mgbe ahụ ka e chepụtara 'bio gas' dịka ụzọ a ga-esi mee ka nke ahụ kwụsị. Etu ahụ ka o si dịkwa na mgbanwe ihu igwe. 'Bio gas' ndị anyị na-arụ anaghị ebute mgbanwe ihu igwe, kama ọ bụ ọtụtụ uru jupụtara n'ime ya," ka ọ gwara anyị.



