Lenacapavir: Lee ọgwụ mgbochi nje HIV e kwuru ka nwaanyị dị ime ghara ịgba

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Gọọmentị Naịjirịa amalitela ikesa ọgwụ mgbochi nje HIV a kpọrọ Lenacapavir, mana ha dọrọ aka na ntị ka ụmụnwaanyị dị ime ghara ịgba ọgwụ a.
Onyeisi ụlọọrụ National Agency for the Control of AIDS (NACA) bu Temitope Ilori, kwuru na nkesa ọgwụ a ga-amalite na steeti asatọ.
Steeti ndị a bụ: Anambra, Ebonyi, Gombe, Kwara, Akwa Ibom, Cross River, Benue, na Abuja (FCT).
Gịnị mere ọgwụ a ji adịghị mma maka nwaanyị dị ime?
Onyeisi ụlọọrụ NACA bụ Temitope Ilori kọwara na Lenacapavir bụ ọgwụ mgbochi nje HIV nke ụlọọrụ "Gilead Sciences" rụpụtara.
A na-agba ya kwa ọnwa isii ọbụla dịka ọgwụ mgbochie ibute nje HIV.
Ọ kọwara na n'agbanyeghị na nnyocha gosiri na ọgwụ ahụ dị mma, kama enwebeghị ihe akaebe ọbụla gosiri na ọ dị mma ka nwaanyị dị ime ṅụọ ya.
Nnyocha gosịrị na LenPrEP dị mma n'ahụ mana a dọọla aka na ntị ka nwaanyị ọbụla dị ime ghara ịṅụ ya.
O kwuru na ọ dị mkpa ịma ọkwa a nke ọma maka na ọgwụ a bụ ọgwụ mgbochi, ọ bụghị ọgwụ e ji agwọ ọrịa.
Onyeisi ụlọọrụ NACA kọwara na Lenacapavir bu mgbakwunye pụrụiche n'ogwu e ji egbochie nje HIV, mana o mere ka o doo anya na ọgwụ a anaghị egbochi mmadụ ibute ọrịa ndị ọzọ.
"Anyị ga-ekwusi ya ike na ọ naghị egbochi ọrịa ndị a na-enweta site n'inwe mmekọ ahụ, ime mkpuke, maọbụ ọrịa ndị ọzọ dịka 'hepatitis'."
Ọ kwuru na n'agbanyeghị na ọgwụ a ga-eme ka mgbochi HIV dị mfe, ọ kọwara na ọ bụghịkwa naanị ya ga-enyere aka gbochie nje HIV, o kwuru na ọ dị mkpa iji okpu nna bụ enyi 'kodom' ma na-aga eme nnyocha ahụ mgbe niile.

Ebe foto si, National Agency for the Control of AIDS (NACA)
Naịjirịa na nsogbu nje HIV
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka NACA siri kwuo, Naịjirịa bụ mba nke anọ n'ụwa niile bu ibu arọ nje HIV, a na-eche na mmadụ otu nde na puku narị itoolu (1.9m) bu nje HIV na Naịjirịa.
Ugbua ọ dị mfe ịnweta ọgwụ nje (ART) mana ọtụtụ ihe na-echere mgbochi nje HIV aka mgba, ọkachasị n'ebe ndị ntorobịa nọ nakwa ọtụtụ n'ime ha ndị a na-akpagbu, ndị na-amaghị ihe ekwe na-akụ nakwa ndị na-enweghị ozi banyere etu ha ga-esi chekwaa onwe ha.
A na-ekwu na nkesa ọgwụ a a na-aṅụ ugboro abụọ n'afọ ga-enyere aka chụọ nje HIV ọsọ ụkwụ eru ala n'afọ 2023 na Naịjirịa.
NACA kwuru na ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mara na ọgwụ a abụghị ọgwụ ọgwụgwụ kama na ọ bụ ọgwụ na-enyere aka gbochie ndị mmadụ ibute nje HIV.
Ihe ruru ọgwụ Lenacapavir 52,000 abatala Naịjirịa, nke a bụ agba nke mbụ e bubatara dịka a ga-amalite ikesa ya na steeti ndị ahụ a gụpụtara.
Mịnịsta nta na-ahụ maka ahụike bụ Iziaq Salako kwuru na a họpụtara Naịjirịa dịka otu n'ime mba itoolu ahụ Globa Funds họpụtara, maka na Naịjirịa kwuru na ha chọrọ ọgwụ ahụ n'ọnwa Maachị 2025.
Ihe mere e ji chọọ iji wayọ ikesa ọgwụ ahụ na nkeji na nkeji bụ iji hụ mara etu ọgwụ a si arụ ọrụ ma marakwa ka o nwere ihe aka mgba o nwereike ibutere mmadụ tupu a malite ikesa ya na Naịjirịa niile.




























