NA EME UGBU A, Trump si na o nyela Tehran atụmatụ 15 maka ikpe udo mana Iran sị na Trump na-ekwuru onwe ya

Nchịkọta akụkọ ndị mere n'izu a

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Michael Ilediagu, Marvelous Obomanu, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Uzoamaka Ewuzie, Adline Okere

  1. Trump si na ya enyela Tehran atụmatụ 15 maka ikpe udo, mana Ịran sị na Trump na-ekwuru onwe ya

    Trump si na ya enyela Tehran atụmatụ 15 maka ikpe udo, mana Ịran sị na Trump na-ekwuru onwe ya

    Kedụ ihe dị n'ime atụmatụ 15 Trump si na ya ji ekpe udo?Anyị ejibeghị anya hụ atụmatụ 15 mba Amerịka si na ha zigaara mba Ịran. O nwebeghị onye pụtara kwuo kpọmkwem ihe dị ya n'ime. Mana ndị ntaakụkọ ụfọdụ na mba Izrel na Amerịka na-ekwu maka atụmatụ a.

    Channel 12 sị na atụmatụ a gụnyere ihe ndị a ha chọrọ:

    • Ụlọọrụ ndị nuklịa dị na Natanz, Isfahan, na Fordow so na ndị ga-akwụsị ọrụ ma mebie.
    • Nnyocha na ileba anya n'ọrụ International Atomic Energy Agency (IAEA) maka ihe ndị na-eme n'Ịran
    • Ịran ga-agbahapụ iji ngwaagha eme ihe na mpaghara ahụ, ma kwụsịkwa iji ego na-akwado ndị ha na ha na-emekọrịta ihe na mpaghara ahụ
    • Ikpochapụ ikike nuklịa niile ha nwere bụ ndị mụbarala ka ọ dị ugbua
    • Ịkwụdosiike na ha agaghị agbalị imepụta ngwaagha nuklia ọzọ
    • O nweghị akụrụngwa nuklịa ọbụla a ga-amụbanye n'ala Ịran, ebe a ga-enyefe ndị nke amụbanyere n'aka IAEA.
    • Okporo Strait of Hormuz ga-eghe oghe oge niile ma mejupụta okporo mmiri anaghị akwụ ụgwọ
    • Ogbunigwe mba Ịran ga-adabere na mkpebi ndị a ga-eme n'ọdịnihu, mana ha agaghị ebu ibu, ma bụrụkwa naanị maka nchekwa onwe.

    Uru Ịran ga-erite n'atụmatụ a:

    • Enyemaka mba Amerịka n'iwulite atụmatụ nuklịa nke onwe na Bushehr maka imepụta ọkụ latrik.
    • Iwezuga ntaramahụhụ niile
    • Iwezuga ihe iyi egwu nke itighachị ntaramahụhụ

    E nwetakwara ozi na e nwereike ịkwụsị ịkwa mgbọ ga-eru otu ọnwa dịka a na-enwe mkparịtaụka, mana ihe ọzọ bụ na a chọpụtabeghị ma ozi a ọ bụ eziokwu, dịka a na-enwebeghị ozi ọbụla si n'obi ọchịchị White House.

  2. ‎Ndị uweojii Imo Steeti anwụchiela onye otu nzuzo a na-enyo enyo na Nekede, napụta ya egbe ‎

    ‎Ndị uweojii Imo Steeti anwụchiela onye otu nzuzo a na-enyo enyo na Nekede, napụta ya egbe ‎

    Ebe foto si, Imo State Police Command

    Ndị uweojii Imo Steeti na njikọaka ha na otu nchekwa Imo State Security Organization anwụchiela onye otu nzuzo a na-enyo enyo, ma napụta ya egbe.

    N’ozi o wepụtara n’ụbọchị Tuzde 24 Maachị 2026, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye sịrị na nke a mere na Nekede dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Owerri West.

    Okoye kwuru na ha kpara ike ahụ site n’ozi dị ezigbo mkpa ha nwetara banyere njem ndị a na-enyo enyo na mpaghara Old Nekede Road n’ụzọ ụtụtụ Satọde 21 Maachị 2026.

    ‎Dịka o siri kwuo, ndị uweojii gbapụrụ ọsọ gaa na mpaghara ahụ ma nwuchie Bright Chidi dị afọ iri abụọ na isii (26), ma napụta ya egbe ‘single-barrel’ na otu mgbọ egbe, oge ha mara ya aka n’akpa.

    “Oge a gbara ya ajụjụ, nwaokroọbịa ahụ a na-enyo enyo kwupụtara na ya bụ onye otu nzuzo ‘Vikings’, ndị aka ha dị n’agwa mpụ dị iche iche,” ka ozi ahụ kwuru.

    Ozi ahụ kwuru na ka ọ dị ugbua, e nyefeela okwu ahụ n’aka ngalaba ndị uweojii State Criminal Investigation Department (SCID) maka ime nnyocha miri emi, dịkwa ka ndị uweojii na-agba mbọ inwuchi ndị ọzọ so n’otu ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  3. Minista na-ahụ maka ọkụ latrik arịọla ndị Naịjirịa mgbaghara, kwee nkwa ịkwalite ikike ọkụ

    Minista na-ahụ maka ọkụ latrik arịọla ndị Naịjirịa mgbaghara, kwee nkwa ịkwalite ikike ọkụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmenti Naịjirịa arịọla ndị Naịjirịa mgbaghara maka ụkọ ọkụ latrik, ma kwee nkwa na a ga-akwalite ya n’ime ụbọchị ndị na-abịa abịa gburugburu Naịjirịa.

    Minista na-ahụ maka ikike ọkụ na Naịjirịa bụ Adebayo Adelabu kwere nkwa a n’ụbọchị Tuzde 24 Maachị 2026, oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu gbasara ịgba ndị o tiri n’ime afọ atọ gara aga.

    Adelabu kọwara na ọ bụ ụkọ gaasị a na-ebugara ụlọorụ ndị na-emepụta ọkụ butere ịmaaka a n’ihi nnukwu ego ha ji ndị na-ekesa gaasị.

    Ọ rụtụrụ aka na agha dị ugbua na mpaghara Middle East nwereike ime ka nsogbu a kawanye njọ.

    Cheta na ndị Naịjirịa na-ahụta ụkọ ọkụ latrik na nso nso a, nke mere ụmụ mmadụ ji akpọ oku ka ndị ọchịchị dozie nsogbu ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  4. Igbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi?, Ka Eke taa ketara anyị ihe ọma ooo

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde Eke 25 Maachị, 2026.

    Gaa n'ihu sọnyere anyị maka akụkọ mere n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ ndị ahụ na-amasị gị.

    Ndewo!

  5. Etu aka si kpara otu nwaanyị na ndị otu ya na-anapụ ndị mmadụ ọgbatumtum n'Anambra

    Kọmishọna ndị uwe ojii na steeti ahụ bu Ikioye Orutugu na otu onye n'ime ndị ejidere.

    Ebe foto si, Ndị Uweojii Anambra steeti

    Nkọwa foto, Ikioye Orutugu

    Ndị uweojii n'Anambra Steeti ejidela mmadụ ise a na-enyo enyo na ha so n’otu ndị omekome na-anapụ ndị mmadụ ọgbatumtum ha n'ike.

    N'ime ndị omekome ahụ gunyere otu nwaanyị e boro ebubo na ọ na-arata ndị a na-anapụ ọgbatumtum ha.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n’Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga, si na ndi uweojii ngalaba 'Rapid Response Squad' nọ n'Awkuzu nwchiri ndị a n’isi ụtụtụ Tuzdee na mpaghara Ihiala.

    Osi na ha nwetara otu egbe, ọgbatumtum atọ a na-enyo na ha bụ nke a napụrụ ndị mmadụ n'ohi, nakwa ihe ndị ọzọ.

    Ikenga sị na e jichiri ndị a n'isi ụtụtụ nke abalị iri abụọ na anọ n'ọnwa Maachị, afọ 2026.

    Ọ kpọrọ aha ha dịka Sunday Chukwudebele (gbara afọ iri abụọ na abụọ), Adaobi Udeze (dị afọ iri abụọ na isii), Chimezie Ifebi (dị afọ iri atọ na ise), Kelvin Chukwuejike (dị afọ iri abụọ na asatọ), na Uzi Chukwuejike Williams Umeh (dị afọ iri abụọ na isii).

    Ọ sị na nnyocha ha mere gosiri na nwaanyị ahụ a na-enyo enyo na-eme ka ọ bụ onye njem, mana rata ndị na-akwọ ọgbatumtum ebe ndị otu ya ndị ọzọ ga-anọ chere iwakpo ha ma zuo ha ohi.

    Kọmishọna ndị uwe ojii na steeti ahụ bu Ikioye Orutugu, jara ndị ọrụ ya ike etu ha si zaa oku mgbe a kpọrọ ha.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  6. Ụgbọelu ndịagha mba Kolombịa akpọkaala ma gbuo mmadụ 66

    Ndịagha juru n'akụkụ ụgbọelu ahụ na-agba ọkụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọchịchị mba Kolombịa ekwuola na ụgbọelu ndịagha ụgbọelu kụkpọrọ na mpaghara ndịda mba ahụ ma gbuo mmadụ 66 ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

    Onyeisi ndịagha ụgbọelu bụ Ọchịagha Carlos Fernando Silva Rueda kwuru na ụgbọelu ahụ bu ndịagha 114 nakwa ndị ọrụ ụgbọelu 11 oge ụgbọelu ahụ kpọkara.

    Ụgbọelu C-130 Hercules nke mba Amerịka rụrụ, bụ nke e ji ebu ndịagha, kụkpọrọ na nso nso obodo Puerto Leguízamo, dị na mpaghara Putumayo.

    Ndị ọrụ gbatagbata ruru ebe ahụ, malitere ịgba mbọ ịzọpụta ndị ka dị ndụ dịka a na-eme nnyocha iji chọpụta ihe kpatara ọdachi ahụ.

    Mịnịsta nchekwa mba Kolombịa Pedro Sánchez kwuru na ụgbọelu ahụ nwere ihe mberede ngwa ngwa o si n’ọdọụgbọelu dị n’obodo Puerto Leguízamo ma kwuo na o bu ọtụtụ ndịagha.

    Ọ kọwara ọdachi dịka nke dị ezi mwute ma bụrụ ihe mgbawa obi.

    Akụkọ kwuru na ogbunigwe ụgbọelu bu tiwapụrụ oge njiji ahụ jiri nke mere ka ụgbọelu ahụ wuru ọkụ.

    Otu onye ọrụ ndịagha kwuru na ndịagha 58 nwụrụ ebe ndịagha ụgbọelu isii na ndị uweojii abụọ nwụkwara.

    Njinji a bụ nke a kwuru na ọ bụ kachasị njo kemgbe ọtụtụ afọ ndịagha ụgbọelu mba Kolombịa na-arụ ọrụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Foto ụgbọelu ahụ na-agba ọkụ

    Ebe foto si, Getty Images

  7. Ndị omekome agbaala ogbunigwe abụọ na mpaghara Kwara na Naịja steeti

    Foto e ji kọwa akụkọ a bụ foto ebe ụlọụka ndị Islam dị n'ahịa Gamboru na Maiduguri na Dizemba 25, 2025, n'akụkụ ugwu n'Ọwụwa anyanwụ nke gburu mmadụ asaa

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Foto e ji kọwa akụkọ a bụ foto ebe ụlọụka ndị Islam dị n'ahịa Gamboru na Maiduguri na Dizemba 25, 2025, n'akụkụ ugwu n'Ọwụwa anyanwụ nke gburu mmadụ asaa

    Ndị a na-enyo dịka ndị omekome tụrụ ogbunigwe n'abalị Monde n'okporoụzọ Luma dị n'okpuruọchịchị Borgu nke Naịja Steeti, ka ha chọrọ iwakpo ndị ọrụ nchekwa na-agara ọrụ ha na mpaghara ebe ahụ. Ihe a mere n'elekere 2 n'ụtụtụ.

    Ndị hụrụ ihe mere sị na ebe ndị o metụtara gụnyere obodo Luma, Babana na Agwara nke na-ahụkarị mwakpo na ọgbụgba ogbunigwe.

  8. Ụtụtụ ọma Igbo ndị ọma

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tuzde 24 Maachị, 2026 ma bụrụkwa ahịa Nkwọ

    Taa ga-akwọtara gị ihe ọma.

    Gaa n'ihu sọnyere anyị maka akụkọ mere na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ ndị ahụ na-amasị gị.

    Ndewo!

  9. Gọvanọ Soludo ahọpụtala nwaanyị mbụ ga-abụ odeakwụkwọ gọọmenti Anambra Steeti

    Chiamaka Nnake bụ nwaanyị mbụ ga-eji ọkwa odeakwụkwọ gọọmenti Anambra steeti

    Ebe foto si, Chiamaka Nnake/LinkedIn

    Gọvanọ Charles Soludo na-achị Anambra Steeti a họpụtala Chiamaka Nnake dịka odeakwụkwọ gọọmenti Anambra steeti.

    Ihe nke a pụtara bụ na Chiamaka Nnake gbara afọ 39, ga-abụ nwaanyị mbụ ga-eji ọkwa odeakwụkwọ gọọmenti Anmbra steeti.

    Chiamaka bụ onye Nwafia dị n’okpuru ọchịchị Njikoka steeti ahụ ma bụrụ onye maara ihe ekwe na-akụ n’ihe gbasara akụnaụba, ego nakwa nhazi.

    Tupu a nhọpụta a, Chiamaka bụbu kọmishọna na’ahụ maka ego mmefu na nhazi akụnaụba n’Anambra steeti ma rụkwa ọrụ dịka onyeisioche ụlọọrụ Solution Fun City Ltd.

    Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Benson Idahosa University ma nweta nzere n’ụlọakwụkwọ Lagos Business School.

    Chiamaka Nnake bụ nwaanyị mbụ ga-eji ọkwa odeakwụkwọ gọọmenti Anambra steeti

    Ebe foto si, Chiamaka Nnake/LinkedIn

  10. Onyeisiala Trump ekwuola na Amerịka na Ịran ga-enwe mkparịtaụka taa banyere ịkwụsị agha

    Foto Onyeisiala Trump na-aga ije n'ime ụlọ obi ọchịchị White House

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Donald Trump mba Amerịka ekwuola na Amerịka na Ịran enweela mkparịtaụka banyere etu a ga-esi agha dị na mpaghara middle east.

    O kwuru na ọ bụ maka mkparịtaụka a mere o jiri nye iwu ka a kwụsịtụ mwakpo Amerịka na-eme n’ogige mmanụ agbidi mba Ịran nke mere ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala daa.

    Mana mịnịstrị mba Ịran na-ahụ maka mmekọ mba ofesi gọnarịrị mkparịtaụka ahụ ma kwuo na ha n amba Amerịka enweghị mkparịtaụka ọbụla.

    N’agbanyeghị nke, Onyeisiala Trump kwuru na ọ bụ Steve Witkof na Jared Kushner nọchitere anya Amerịka na mkparịtaụka ahụ. O kwuru na ọ bụrụ na nkwụsịtụ ahụ gaa nkeọma, agha ahụ ga-akwụsị kpam kpam.

    Cheta na Onyeisiala Trump nọrọ n’ụbọchị Satọde nye Ịran awa iri anọ na asatọ ka ha mepee awara mmiri Hormuz ma kwuo na ọ ga-amalite ịwakpo ha ma ọ bụrụ na ha emeghị ihe o kwuru.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị:

  11. Ụlọikpe atụọla onye bụbu nnukwu odekọ ego mịnịstrị nchekwa Naịjirịa mkpọrọ afọ 72.

    Foto Chukwunyere Nwabuoku rụrụ ọrụ dịka onyeisi na-ahụ maka ego na mịnịstrị nchekwa Naịjirịa malite n'afọ 2019 ruo 2021

    Ebe foto si, EFCC/X

    Ọkikpe James Omotosho nke Ụlọikpe Ukwu dị n’Abuja, atụọla onye bụbu nnukwu odekọ ego Naịjirịa bụ Chukwunyere Nwabuoku mkpọrọ afọ iri asaa na abụọ.

    N’ikpe ya, Ọkaikpe Omotosho kwuru na ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) nwetere ihe akaebe dị okpụrụkpụ gosiri na ebubo nrụrụaka ahụ ha boro Nwabuoku bụ eziokwu.

    Ọkaikpe Omotosho tụrụ Nwabuoku mkpọrọ afọ asatọ n’otu n’otu n’ebubo itoolu ahụ EFCC boro ya.

    Ọkaikpe Omotosho gara n’ihu katọọ nrụrụaka ego ahụ Nwabuoku mere oge o ji ọkwa dịka onyeisi na-ahụ maka ego na mịnịstrị nchekwa Naịjirịa ma too EFCC maka mbọ ha gbara iwuchi ya ma kpụpụta ya n’ụlọikpe.

    Ụlọikpe kwuru na ọ bụ eziokwu na Nwabuoku weghachitere nde narị nde naịra abụọ (N200m) dịka nnyocha e mere si kwuo.

    Cheta na ụlọọrụ EFCC kpụpụrụ Nwabuoku n’ụlọikpe n’ọnwa Jenụwarị 15, 2025 maka ebubo itoolu gbadoro ụkwụ na nrụrụaka oge o ji ọkwa dịka onyeisi na-ahụ maka ego na mịnịstrị nchekwa Naịjirịa n-afọ 2019 ruo 2021.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  12. Starmer ekwuola na enwebeghị ihe gosiri na mba Ịran chọrọ ịwakpo Briten

    Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Keir Starmer

    Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer ekwuola na enweghị ihe gosiri na Iran chọrọ iwakpo ha.

    Starmer kwuru nke a dịka onyeisi ọrụ nchekwa mba Izrel kwuru na mba Iran enweela ngwaagha nwereike iru Lọndọn, Paris maọbụ Berlin”.

    E kwuru n’akara X na Iran atụọla ogbunigwe ruru Diego Garcia bụ ebe mba Amerịka ji mee ọdọ agha.

    Mana mgbe a jụrụ Starmer na mba Briten a nọ ebe Iran nwereike ịtụ ha ogbunigwe ka o kwuru na “enwebeghị ihe gosiri na Ịran chọrọ iwakpo anyị”.

    Ọ gara n’ihu kwuo n amba Briten na-agba mbọ etu agha Amerịka na Izrel na-alụ n’Iran ga-esi akwụsịtụ ma ghara ime ka Briten soro lụọ ya.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  13. Ekpere m bụ ka ụmụnwaanyị ndị e metọrọ n’ozoro nata ọgwụgwọ - Oluremi Tinubu

    Ekpere m bụ ka ụmụnwaanyị ndị e metọrọ n’ozoro nata ọgwụgwọ nsọ - Oluremi Tinubu

    Ebe foto si, Getty Images

    Nwunye onyeisiala Naịjirịa bụ Oluremi Tinubu akatọọla mmetọ e metọrọ ụmụnwaanyị n’obodo Ozoro dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Isoko North na Delta Steeti, ma kpee ekpere ka ụmụnwaanyị ọnọdụ ahụ metụtara nata ọgwụgwọ nsọ.

    Nke a dị n’ozi Oluremi Tinubu binyere aka na ya n’ụbọchị Sọnde 22 Maachị 2026 ma mee ka o rute anyị aka.

    “Ahụla m onyonyoo si n’Ozoro dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Isoko North na Delta Steeti, nke gosiri ebe a na-emetọ ụmụaka ndị nwaanyị, n’ihe kwesịrị ịbụ emume obodo”.

    “Dịka m nwere nnukwu ịhụnaanya maka ụbara omenala na ọdịnaala ndị mere ka anyị bụrụ mmadụ, ekwenyere m na o nweghị omenala ọbụla nyere nwoke ikike ịmetọ ugwu na nnwereonwe nke nwaanyị,” ka nwunye onyeisiala kwuru.

    Tinubu kelere ndị uweojii Naịjirịa maka ndị ha nwuchirila, ma gbaa ụlọọrụ niile kwesịrị ekwesị ume ka ha hụ na ndị niile aka ha dị n’arụ ahụ nwetara ntaramahụhụ kwesịịrị ha dịka ọ dị n’iwu.

    Ọ gwara ụmụnwaanyị niile ọnọdụ ahụ metụtara ka ha chọọ enyemaka ndị kwesịrị ekwesị maka ahụike na uche ha.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    N’ọzọ yiri ya, Obieze Ozoro dị na Delta Steeti akatọọla omume ike, mmetọ, mmaja na mmekpaahụ e mesoro ụmụnwaanyị n’oge emume Alue-Do nke afọ 2026.

    N’ozi Anthony Ovietoboro bụ Ogbogbo Ibuka I, Ovie nke obodo Ozoro wepụtara n’ụbọchị Sọnde 22 Maachị 2026, Obieze ahụ kọwara mmetọ e metọrọ ụmụnwaanyị abụọ n’oge emume ahụ dịka ihe dị njọ, ihe na-ekweghị nnabata nakwa nke na-agbasoghị njirimara na ọdịnaala ndị Ozoro nakwa Isoko.

    O mere ka o doo anya na Obieze ahụ anaghị akwado ụdị mmetọ ọbụla, ma kwuo na ọ bụghị eziokwu na obodo Ozoro kwadoro omume ọjọọ ahụ, dịka e si ebugharị ya na soshal midịa.

    Ka ọ dị, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Delta Steeti bụ Bright Edafe ekwuola na aka ndị uweojii akparala mmadụ iri na isii a na-enyo enyo na aka ha dị na mmetọ ụmụnwaanyị n’oge emume Alue-Do.

    Oge ọ na-ekwu okwu n’ihe omume a haziri n’ụlọmgbasaozi Channels TV, Edafe kwuru na a kpụgaala ndị ahụ a nwuchiri n’isi ụlọọrụ ndị uweojii maka ime ha nnyocha miri emi.

    O kwukwara na ọ bụghị eziokwu na emume ahụ bụ “emume idina ụmụnwaanyị n’ike”, ma sị na o nwebeghị mkpesa ọbụla ha nwetara gbasara idina nwaanyị n’ike site n’emume ahụ.

  14. Tinubu ekwela nkwa ịga n’ihu n’ọgụ ọ na-alụ megide enweghị nchekwa

    Tinubu ekwela nkwa ịga n’ihu n’ọgụ ọ na-alụ megide enweghị nchekwa

    Ebe foto si, Bayo Onanuga

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ekwela nkwa na ya ga-agbasikwu mbọ ike n’agha a na-ebu megide enweghị nchekwa n’akụkụ mba ahụ dị iche iche.

    Tinubu kwuru nke a n’ụbọchị Sọnde 22 Maachị 2026 oge ọ nabatara Osote Onyeisiala bụ Kashim Shettima na ndị gọvanọ iri abụọ na atọ ndị ọzọ n’ụlọ ya dị na Legọs maka emume Eid el-Fitr.

    Ozi ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala bụ Bayo Onanuga wepụtara kwuru na Onyeisiala sịrị na enweghị nchekwa bụ nsogbu kachasị echere Naịjirịa aka mgba n’oge ugbua.

    Tinubu gwara ndị gọvanọ ka ha na-elekọta ndị ụwa na-atụ n’ọnụ n’oge a ọkachasị dịka ọgbaaghara dị na mpaghara Middle East kawanyere njọ ma bute ihe isiike.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  15. Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi?, Ka Afọ taa fọtara anyị ihe ọma ooo

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde Afọ 23 Maachị, 2026.

    Gaa n'ihu sọnyere anyị maka akụkọ mere n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ ndị ahụ na-amasị gị.

    Ndewo!

  16. Ụlọọrụ mmanụ gaasị ekwesịghị ịnọ nso ebe obibi - Gọvanọ Bassey Otu

    Aka na-achị Cross River Steeti Bassey Otu na ndị ọrụ gọọmentị ya mere njem nleta ebe ihe mgbawa mere ma gbuo ọtụtụ mmadụ

    Ebe foto si, Bassey Otu/Facebook

    Nkọwa foto, Aka na-achị Cross River Steeti Bassey Otu na ndị ọrụ gọọmentị ya mere njem nleta ebe ihe mgbawa mere ma gbuo ọtụtụ mmadụ

    Gọvanọ Krọs Riva Steeti bụ Bassey Otu ekwuola na ụlọọrụ mmanụ gaasị ekwesịghị ịnọ nso ebe ndị mmadụ bi ma kwuo na ọchịchị ya ga-eme ihe gbasara ya.

    Otu kwuru nke a dịka ọ gara njem nleta n'obodo Edibe Edibe dị n’okpuru ọchịchị Calabar South ebe ihe gbawara n’otu ụlọọrụ mmanụ gaasị ma merụọ ọtụtụ ndị mmadụ ahụ.

    Gọvano Bassey Otu kọwara mgbawa ahụ mere n’ụbọchị Satọde abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Maachị afọ 2026 dịka nnukwu mmebi, ma kwupụta na gọọmenti ya ga-akwụ ụgwọ ahụike n'efu maka ndị niile ihe metụtara ma tụlee ịkwụghachi ndị ihe onwuwe ha mebiri emebi.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebea:

    Ụlọọrụ ebe a na-ere mmanụ gassị gbara ọkụ na Cross River steeti

    Ebe foto si, Bassey Otu/Facebook

    Nkọwa foto, Ụlọọrụ ebe a na-ere mmanụ gassị gbara ọkụ na Cross River steeti
  17. NDLEA anwụchiela ndị chọrọ ibu ọgwụike gaa Yurop n'ọdọụgbọelu Legọs

    NDLEA anwụchiela ndị chọrọ ibu ọgwụike gaa Yurop n'ọdọụgbọelu Legọs

    Ebe foto si, NDLEA/Facebook

    Ndị ụlọọrụ na-ebu agha megide ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchiela ndi na-atụ mgbere ọgwụike chọrọ ịbu 'mkpụrụmmịrị' - e zoro n'ime igbe akwụkwọ, uwe oyi, na ude ahụ gaa mba Yurop.

    A nwuchiri ndị a n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed Airport dị n'Ikeja, nakwa n'otu ụlọọrụ nzipuozi dị na Legọs.

    E jidere mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha tụrụ mgbere ọgwụike a chọrọ ibuga na mba Ịtali.

    Otu n'ime ha bụ Friday Ehianuka dị afọ iri atọ na asaa, onye e jidere n'ụbọchị Fraịde, 20 Maachị 2026, oge ọ na-achọ ịga Rome dị na mba Ịtali.

    A nwuchịrị ya ka ọ na-achọ ịbanye n’ụgbọelu Ethiopian Airlines ebe o zoro mkpụrụ ọgwụike Tramadọl (225mg) ruru puku abụọ, narị isii na iri itoolu na asatọ (2,698) n'ime mkpọ ude ahụ dị n'ime akpa ya.

    Ehianuka bi na Milan, kwetara na a ga-akwụ ya ego Euro ma njem ibubata ọgwụike na mba Ịtali gara ya nke ọma.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  18. Mgbawa gaasị emeruọla ụmụ mmadụ ahụ na Calabar

    Teams work on the scene where a tanker carrying compressed natural gas (CNG) exploded and caused the death of 2 people and injured 14 other near Otedola Bridge in Lagos state

    Ebe foto si, Getty Images

    Mgbawa mere n’otu ụlọọrụ mmanụ gaasị emeruọla ụmụ mmadụ ahụ na Calabar bụ isi obodo Krọs Riva Steeti.

    Mgbawa ahu butere nnukwu ụjọ ka o mere n’ụbọchị Satọde 21 Maachị 2026 n’ime obodo Edibe Edibe, dị n’okpuru ọchịchị Calabar South.

    Mgbawa ahụ mere n'otu ụlọọrụ mmanụ, merụrụ ọtụtụ mmadụ ahụ n'ụzọ dị iche iche, mebiekwa ụlọ na akụrụngwa ndị ọzọ dị ebe ahụ.

    Ndị hụrụ oge o mere kọwara na ha nụrụ mgbawa dara ụda, nakwa ọkụ na-agba n'akụkụ ụfọdụ ụlọọrụ gaasị ahụ nke mere ka ndị mmadu gbaa ọsọ ndụ.

    Ndị ọrụ gbatagbata na ndị nchekwa gbatara ọsịịsọ iji lekọta ọnọdụ ahụ ma nyere ndị merụrụ ahụ aka.

    A na-atụ anya na gọvanọ Krọs Riva Steeti bụ Bassey Otu ga-aga njem nleta ebe mgbawa ahụ mere iji hụ oke mmebi o butere.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  19. Amerịka ga-agbari ụlọọrụ ọkụ latrik mba Ịran ma ọ bụrụ na ha emepeghị ụzọ mmiri 'Strait of Hormuz' tupu ụbọchị abụọ agwụ - Trump

    Amerịka ga-agbari ụlọọrụ ọkụ latrik mba Ịran ma ọ bụrụ na ha emepeghị ụzọ mmiri 'Strait of Hormuz' tupu ụbọchị abụọ agwụ - Trump

    Onyesịsịala mba Amerịka bu Donald Trump ekwuola na a ga-agbari ụlọọrụ ọkụ latrik mba Ịran ma ọ bụrụ na emepeghị ụzọ mmiri 'Strait of Hormuz' - nke dị oke mkpa n’ibupụ mmanụ ụgbọala n'ụwa niile, tupu ụbọchị abụọ agwụ.

    Na nzaghachi, Ịran kwuru na ha ga-agbarikwa akụrụngwa ọkụ latrik nke mba Amerịka dị na Middle East ma ọ bụrụ na a wakpoo ụlọọrụ ọkụ latrik ha.

    Ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ n'obodo Dimona dị na mba Izrel mgbe ogbunigwe agha Ịran dara n'akụkụ ebe a na-emepụta ngwaagha nuklia.

    Okwu Trump bịara mgbe o kwuchara sị: 'Ịran chọrọ ka anyị nwee nkwekọrịta, mana mụ onwe m achọghị'. Onyeisiala Amerịka kwuburu na ya na-atụle 'ibelata maọbụ kwụsị’ agha ọ na-alụso Ịran.

    Ka ọ dị ugbua, mba Izrel na-ekwu na ha tụrụ ogbunigwe n'isi obodo Ịran n'abalị ụnyaahụ. Saudi Arabia na United Arab Emirates kwukwara na ha gbochiri mwakpo ogbunigwe na 'droonu' bịara n'obodo ha.

    Ụlọọru BBC ghọtara na ndịagha Ịran gbara mbọ ịwakpo ụlọọrụ ndịagha United Kingdom na Amerịka dị na Diego Garcia n'abalị Tọzde banyere n’ụtụtụ Fraịde. Odeakwụkwọ mba ofesi na UK bụ Yvette Cooper, ekwuola na UK agaghị etinye aka n'agha ahụ.

    “Ịgbaghapụ ebe obibi gị dị njọ karịa agha n'onwe ya,” ka ndị Ịran na-akwa akwa arịrị kọọrọ BBC maka ihe ha na-ahụ n'agha ahu.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  20. Ọkụ agbariela mpaghara ahịa ‘Bridge Head Market’ Ọnịcha

    Flames billow from burning houses during a wildfire in Concepcion, Chile, on January 18, 2026.

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọkụ tiwapụrụ n’ime abalị agbariela mpaghara ebe a na-ere akụrụngwa e ji arụ ọrụ mmiri n’ahịa ‘Bridge Head’ Ọnịcha dị n’Anambra Steeti.

    Ọkụ ọgbụgba ahụ lara ọtụtụ ngwaahịa n’iyi ma bute ọnọdụ amaghị nke a ga-eme n’ahịa ahụ na-ekwo ekwo.

    Akụkọ kwuru na ahịa ahụ dị n’okporoụzọ si Ọnịcha gawa Ọka baara ọkụ n’abalị Fraịde 20 Maachị 2026 ma regide ruo n’ụzọ ụtụtụ Satọde 21 Maachị 2026.

    Ndị hụrụ oge o mere kwuru na ọkụ ahụ malitere mgbe ọ fọdụrụ ihe dịka nkeji ise ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị, ma jiri ọsịịsọ fesaa na mpaghara dị iche iche tupu a kwụsị ya, nke mere o jiri raa ndị mmadụ ahụ ibupụ ngwaahịa ha.

    Mbọ niile ndịahịa gbara iji nweeike bupụta ngwaahịa ha kụrụ afọ n’ala n’ihi etu ọkụ ahụ si agbasi ike.

    Ka ọ dị, Onyeisi okpuru ọchịchị ime obodo Ọnịcha Saụt bụ Emeka Orji kpọtara ndị mgbanyụọkụ n’ahịa ahụ, nke mere e ji nweeike gbanyụọ ọkụ ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Trending Now