Chuck Norris na-eme ejije anwụọla ka ọ gbachara afọ 86
Ndị mmadụ amalitela izibata ozi nkasiobi site n'akụkụ ụwa niile maka nwaafọ Amerịka na-eme ejije bụ Chuck Norris, onye nwụrụ ka ọ gbachara afọ iri asatọ na isii (86).
"O nwereike bụrụ onye nwere ahụ onyeagha mana obi ya jupụtara n'ịhụnaanya," ka nwa ya nwaanyị bụ Danilee Norris kwuru.
Nwaafọ Sweden na-eme ejije ịkụ ọkpọ bụ Dolph Lundgren, onye ya na Norris mekọrọ ejije sịrị na "ọ na-elekwasa ya oge niile dịka onye nlereanya".
A maara Norris maka agwa ya n'ejije Walker, Texas Ranger nakwa The Way of the Dragon, nke ya na Bruce Lee lụsoro onwe ha ọgụ.
Ndị Ezinaụlọ ya ji "obi mwute" kwupụta gbasara ọnwụ ya" n'ozi ha wepụtara n'Instagram.
"O biri ndụ n'okwukwe, ebumnobi nakwa nnyefechasị onwe nye ndị ọ hụrụ n'anya," ka ezinaụlọ ya kwuru. "Site n'ọrụ ya, nkwanyeugwu na ọmịiko, ọ kpalitere mmụọ nde kwuru nde mmadụ gburugburu ụwa ma nwee ihe a ga-eji cheta ya oge niile.
Ozi ahụ gbakwunyere: "N'anya ndị ụwa, ọ bụ onye na-eme ejije, onye na-eti ọkpọ na njirimara ikike.
N'ebe anyị nọ, ọ bụ di maara ọrụ ya, nna na nna nna nwere ịhụnaanya, nwanne nwoke na-enweghị atụ nakwa obi nke ezinaụlọ anyị."

Ebe foto si, Getty Images

Ebe foto si, Getty Images





























