Nnamdi Kanu: Ejimakor ekwuola na usoro mkpegharị ikpe ya na-aga nke ọma

Nnamdi Kanu yi efe ọcha o yi kamgbe anwuchịrị ya n'afọ 2021. Kanu nọdụrụ n'ụlọikpe n'etiti ndị ọrụ DSS
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ọkaiwu onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Maazị Nnamdi Kanu ekwuola na akwụkwọ ha tinyere maka mkpegharị ikpe nwaamadị ahụ bụ onye ụlọikpe ukwu dị n'Abụja tụrụ nga mkpụrụ ọka, na-aga n'ihu nke ọma.

Aloy Ejimakor wepụtara ozi n'akara soshal midịa ya n'ụbọchị Wenezde 8 Eprel 2026, kwuru na ọ bụ n'ọnwa Febụwarị 2026 ka ha tinyere akwụkwọ maka mkpegharị ikpe Nnamdi Kanu bụ onye Ọkaikpe James Omotosho tụrụ nga mkpụrụ ọka maka ebubo iyi ọha egwu na ihe ndị ọzọ n'ọnwa Nọvamba 2025.

Ejimakor gara n'ihu kwuo na o nwere ọtụtụ ihe nke ụlọikpe tụrụ anya ka ha mee tupu mkpegharị ikpe ahụ amalite.

O kwuru na onye na-edebanye aha n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja ga-achịkọta "Ndekọ Mkpegharị" zuru oke. Nke a gụnyere akwụkwọ ebubo, usoro ikpe niile, ihe ngosi, mkpebi ikpe, na ntaramahụhụ e nyere ya.

O kwuru na mgbe a na-eme nkea, na ndị ọkaikpe Nnamdi Kanu na-esonye n'usoro ahụ iji ahụ na ihe niile gara nke ọma.

"Ya mere, onye na-edeba aha nwere obere oge iji mechaa ma ziga ndekọ ahụ na ndekọ ụlọikpe mkpegharị. Mana emeela nke a."

Ọ kọwara na "ihe ọzọ bụ itinye akwụkwọ arụmụka edere ede 'Briefs of Argument' n'ime ụbọchị iri anọ na ise nke a natara akwụkwọ ndekọ ahụ. Nke a bụ arụmụka edere ede nke na-akọwapụta arụmụka iwu gbasara ihe kpatara mkpesa na ihe kpatara e ji ekwu ka akagbuo mkpebie ikpe ahụ.

Ejimakor kwuru na mgbe e tinyere ma nata akwụkwọ arụmụka Nnamdi Kanu, onye na-azara ọnụ ga-etinyekwa akwụkwọ nkọwa nke ya n'ime ụbọchị iri atọ ka e nyechara ya akwụkwọ nkọwa ahụ.

"Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa, ndị ọkaiwu Nnamdị Kanu nwere ike itinye obere nkọwa azịza n'ime ụbọchị iri na anọ ma ọ bụrụ na ndị ọkaiwu welitere isi ihe ọhụrụ kwesịrị nzaghachi.

"Ya mere, akwụkwọ nkọwa bụ isi ihe nke Ụlọikpe Mkpegharị ga-agụ dịka arụmụka iji ọnụ akọ na-eme ka ha doo anya," ka ọ gbakwunyere.

Ejimakor kwuru na ọ bụ ozugbo e tinyere akwụkwọ niile ka Ụlọikpe Mkpegharị ga-edepụta okwu a dịka nke a ga-anụ n'ụlọikpe.

O kwukwara na ọ bụ mgbe ahụ ka a ga-ahazi ụbọchị a ga-ekpe ikpe ahụ ma gwa ndị niile o metụtara.

Nnamdi Kanu etinyela akwụkwọ n'ụlọikpe maka mkpegharị ikpe ya

Nnamdi Kanu yi efe ọcha n'ụlọ ikpe dị n'Abuja, n'oge a ka na-ekpe ikpe ya n'afọ 2025
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na-agaghachị n'ụlọikpe maka ikpe a mara ya, ọ na-aga ime gịnị?

Akwụkwọ ikpe e denyere ụlọikpe maka ekpere ikpegharị ikpe Nnamdi Kanu bụ onye ndu ndị otu Indigenous People of Bịafra (Ipob) bidoro na-efesa na soshịal midịa n'abalị nke anọ n'ọnwa Febụwarị 2026.

BBC Igbo kpọtụrụ ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakọ. o wee dekwa n'igwe soshịal midịa ya na ọ bụ eziokwu na Nnamdi Kanu edegala ụlọikpe mkpegharị akwụkwọ ikpegharị ikpe ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Ka Ọkaikpe Omotosho kpechara Nnamdi Kanu ikpe mkpụrụọka, ndị ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimako degarala ụlọikpe ikpe dịka o jiri gwa BBC Igbo na mkparịtaụka na ọ ga-ede maka mkpegharị ya bụ ikpe ahụ.

Gịnị dị n'akwụkwọ ikpe ahụ Nnamdi Kanu dere?

Nnamdi Kanu degarala ụlọikpe ayịyọ ya, o dere na ọ na-agbagha ikpe nke ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja kpere n'isi ya.

Ọkwa ahụ nwere Gọọmenti etiti Naijirịa dịka ndị ga-asa ọsịsa, bụ nke a gbara akwụkwọ n'ụbọchị anọ n'ọnwa Febụwarị (2026) ma nwee ihe mgbakwasị ụkwụ maka mkpegharị ikpe iri abụọ na abụọ, nke gụnyere, na eleghara ihe mgbochi mbụ ya na akwụkwọ mgbapụta na-echere anya, nakwa na a mara ya ikpe n'agbanyeghị na ikpe ụlọikpe mkpegharị gara aga na-ekwupụta na ikpe mbụ ahụ bụ ihe efu.

Ọ kọwakwara na onye ọkaikpe ahụ "mehiere n'iwu site n'ịkwụsị usoro usoro na ikike" nke ikpe 2017 gbabiri agbabi..

N'ihe ndị ọzọ e welitere na ọkwa mkpegharị ikpe, Kanu boro onye ọkaikpe na-ekpe ikpe na-ezighị ezi maka iwere anọghị ya na Naịjirịa dịka ihe ọjọọ. O kwukwara na a mara ya ikpe n'okpuru iwu kagburu, kpegharịa ya n'ihe gbasara eziokwu, ma maa ya ikpe n'echeghị mbelata ma ọ bụ "allocutus," na ndị ọzọ.

Foto akwụkwọ mkpegharị Nnamdi Kanu degarala ụlọikpe nke e binyere aka

Ebe foto si, Aloy Ejimako/X

Nkọwa foto, Akwụkwọ mkpegharị Nnamdi Kanu degarala ụlọikpe

Ya mere, ọ na-achọ enyemaka ndị a:

Nkasiobi ọ na-asị ka ụlọikpe nye ya

1. Ekpere ya bụ ka Ụlọikpe Mkpegharị nye ikpe a ohere mkpesa.

2. Inye iwu ka Ụlọikpe Mkpegharị kagbuo ikpe nke ndị

Onye na-arịọ arịrịọ dị na ebubo Mba; FHC/ABJ/CR/383/2015 site na

Onye ọkaikpe nke Federal High Court.

3. Iwu nke Ụlọikpe Mkpegharị na ohere, ịtụgharị na ịtọ ntọala

wezuga ahịrị ahịrịokwu/ntaramahụhụ nyere onye mkpegharị ikpe site n'aka onye ugwu

ikpe Federal High Court Judge na ebubo No; FHC/ABJ/CR/383/2015.

4. Iwu nke Ụlọikpe mkpegharị ga-ahụ na na-ahapụ ndị ahụ

Onye na-arịọ arịrịọ n'ihe gbasara ụgwọ niile dị n'aka Nọmba FHC/ABJ/CR/383/2015.

5. Na maka iwu ndị ọzọ dịka Ụlọikpe a na-asọpụrụ nwere ike iche na ọ dabara.