Mwakpo ahụ e jiri gbuo ọtụtụ mmadụ na Borno Steeti dị ezi mwute – Gọvanọ Babagana Zulum

Gọvanọ Babagana Zulum na-achị Borno Steeti ekwuputela ezi mwute ya na mwakpo ahụ gburu ọtụtụ mmadụ na steeti ya n'ụbọchị Mọnde 16 Maachị, 2026 ma kwuo na ya na ndịisi ndịagha nakwa ndị ọrụ nchekwa dị iche iche amalitela ọrụ iji gbochie ụdịrị ọdachi ahụ ịdakwasị steeti ya ọzọ.
Na mkparịtaụka ya BBC nwere, Gọvanọ Zulum kwuru na ya nọ na mba Sawudi Arebịa oge ya wetara ozi banyere mwakpo ahụ ma kwuo na nke a mere ka ọ bata Naịjirịa ngwa ngwa. O kwuru na ọ na-ezigara ezinaụlọ ndị niile mwakpo ahụ metụtara ozi iti aka n'obi.
Gọvanọ Zulum kwuru na ndịagha malitere ọrụ na mpaghara Timbuktu Triangle n'ọnwa abụọ gara aga ma kwuo na ndịagha nọ ọrụ ugbua na Sambisa Game Reserve iji hụ na e kpochapụrụ ndị na-eyi ọha egwu ahụ tupu oge mmiri ozuzo abịa.
Oge a jụrụ ya ndị aka ha dị na mwakpo ahụ, Gọvanọ Zulum kwuru na nnyocha ya mere chọpụtara na ndị omekome ise batara steeti ya ebe mmadụ atọ n'ime ha tiwapụrụ ogbunigwe ha yi n'ahụ ha.
O kwuru na ndị ọrụ nchekwa amalitela ime nnyocha iji chọpụta mmadụ abụọ nke ọzọ gbara ọsọ iji gbochie ogbunigwe ha bu ka ọ ghara itiwapụ.
O mere ka o doo anya na ndị ọrụ nchekwa kwụrụ chịm ịhụ na enwere ezi nchekwa na Borno steeti dịka a na-eme emume Eid-el-Fitr.
Mwakpo Maiduguri: Mmadụ 23 nwụrụ,103 merụọ ahụ- Ndị uweojii

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ndị uweojii ekwuola na mmadụ 23 nwụrụ , ebe mmadụ 108 merụụ ahụ na ogbunigwe gbara na Maiduguri ,isiobodo Borno Steeti ụbọchị Monde.
Ndị a na-enyo na ha bụ ndị Boko Haram wakporo ebe atọ na Maiduguri; ahịa 'Monday Market', Ọnụ ama e si aba ụlọọgwụ 'University of Maiduguri Teaching Hospital'(UMTH) nakwa nso 'ụlọnzipụ ozi 'Post Office' ụbọchị Monde.
End of Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Otu onye hụrụ ihe merenụ kọwara ụlọmgbasa ozi BBC etu mwakpo ahụ mere n'obodo Maiduguri, Borno steeti siri mee.
O kwuru na "Anyị nọdụrụ ala na-aṅụ mmiri, mgbe anyị nụrụ mkpọtụ wee hụ ka ndị mmadụ na-agba ọsọ, ọbara juru ụfọdụ n'ime ha ahụ. Site n'ebe ahụ, mmadụ niile gbara ọsọ na-achụ ndị ahụ. E ji m anya mụ hụ ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ."

Onye ọzọ hụrụ ihe merenụ kwukwara na ya hụrụ ndị mmadụ ka ha nọ n'ọnọdụ ihe ijuanya maka ihe merenụ.
O kọwara na: "Ndị m hụrụ ka ha na-abịa bụ mmadụ ise, otu nwaanyị na otu nwatakịrị, na ụmụnwoke abụọ. Ebe ogbunigwe ahụ gbawara, ọ dị kpọmkwem n'akụkụ ebe a na-ebu ibu nke Ungwanni, mana ebe ogbunigwe ahụ gbawara, e nwere ndị na-ese ihe, e nwere ndị na-ere ahịa na-ere ngwaahịa, ha niile nwụrụ anwụ."

Ebe foto si, Reuters
N'ebe dị nso na ụlọọgwụ nkụzi Mahadum Maiduguri, otu onye akaebe kwuru na e nwere ndị mmerụrụ ahụ na ndị nwụrụ anwụ.
Ọ gara n'ihu kwuo, "Ahụrụ m mmadụ atọ e kpuchiri ekpuchi ma na ha yiri ka ha anwụọla, mana ndị a kpọbatara jupụtara n'ọbara, ụmụnwaanyị, ụmụnwoke, na ọbụna ụmụaka."
Ndị na-eyi ọha egwu agaghị enwe nchekwa na Naịjirịa - Onyeisiala Tinubu

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onyeisiala Bola Tinubu ekwuola na enweghị ebe ndị na-eyi ọha egwu ga-enweta nchekwa na Naịjirịa.
Onyeisiala Tinubu kwuru nke a n'ozi iti aka n'obi o nyere ndị ndị Borno maka mwakpo ndị omekome mere n'oge na-adịbeghị anya na steeti ahụ.
Dika o siri kwuo, ndị ọchịchị Naịjirịa ga-achọta ndị na-eyi ọha egwu, lụso ha ọgụ, ma merie ha kpamkpam.
N'ozi nke onye enyemaka pụrụ iche nke Onyeisiala Tinubu bụ Bayo Onanuga wepụtara n'akara soshal midịa ya nke Onyeisiala Tinubu binyere aka, ka o kwuru na akụkọ mwakpo ọhụrụ a nke sitere na Maiduguri, Borno steeti, na-ewute ya nke ukwuu.
"Ana m eru uju maka ndị nwụrụ anwụ, na-emere ndị merụrụ ahụ ebere ma na-akwado ndị Borno n'oge ihe isi ike a," ka Tinubu kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo: "Achọrọ m ime ka o doo anya nke ọma na ihe ndị a na-eme bụ mbọ ikpeazụ ndị omekome na ndị na-eyi ọha egwu na-agba iji tinye ma gbasaa egwu, dịka ha na-enwe nrụgide mgbe niile site n'aka ndịagha anyị na ndị ọrụ nchekwa na-arụ ọrụ n'ebe dị iche iche."
Onyeisiala Tinubu kwuru na Naịjirịa ga na-agba mbọ megide ndị omekome niile, ebe ọ bụla ha nọ.
O kelekwara ndịagha Naijirịa maka obi ike na mmụọ ọgụ nke ha, dịka ha zaghachiri mwakpo ndị omekome a haziri ahazi megide ọnọdụ ndịagha na steeti ahụ.
"Mwakpo ndị a mere na Mọnde bụ ihe ọjọọ nke ndị otu ndị omekome nwere echiche ọjọọ. Ndịagha anyị na ndị nkịtị ga-ebelata ma chụpụ ha.
O kwupụtara na ya kwadoro ịzụta akụrụngwa ndịagha ọhụrụ iji kwalite agha ndị ọrụ nchekwa na-ebu megide ndị na-eyi ọha egwu.
Ka ọ dị ugbua, Onyeisiala Tinubu kwuru na ya enyela ndị isi nchekwa na Naịjirịa iwu ka ha kwaga na Maiduguri iji lekọta ọnọdụ ahụ.
"Enyekwarala m ndị ọrụ gbatagbata iwu ka ha nye ndị merụrụ ahụ nlekọta kwesịrị ekwesị."

Gọvanọ Zulum akatọla mwakpo ahụ
Aka na-achị steeti ahụ bụ Babagana Zulum akatọla mwakpo ahụ ma kọwaa ya dịka ihe jọgburu onwe ya nke e mere megide ndị aka ha dị ọcha, n'agbanyeghị na ọ bụ ọnwa Ramadan.
Nkwupụta nke ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ steeti Borno, Dauda Iliya, wepụtara kwuru na gọvanọ ahụ kpọrọ oku ka e mee ka nchekwa dịkwuo elu na mpaghara ebe a na-efe ofufe.
O kwuru na, "Mgbọ ndị ahụ mere n'akụkụ ụfọdụ nke Maiduguri, na Mọnde, na-ewute m nke ukwuu."
O tikwara ezinaụlọ ndị ihe metụtara aka n'obi maka mwakpo ahụ.
Ogbunigwe Maiduguri mere na nso ahịa a ma ama, ụlọọgwụ nakwa ụlọọrụ nzipu ozi
Ogbunigwe gbara na nso Ahịa Monday Market nakwa Ụlọọgwụ Borno Teaching Hospital egbuola ọtụtụ ndị mmadụ amabeghị ọnụọgụgụ ha.
Ihe onyonyo na-efegharị n'ịntaneti na-egosi ka ndị ọrụ gbata gbata n'ụlọọgwụ dị na Maiduguri si elekọta ndị merụrụ ahụ mana anyị amaghị ma ihe onyonyo ahụ ọ bụ eziokwu.
Aka na-achị steeti ahụ kwuputara ọdachị a akpọghị aha onye ọbụla ma ọ bụ ndị mere mkpa mkpa a.
Ogbunigwe nke mbụ dara n'ụlọọrụ nzipu ozi nke nọ n' etiti obodo, ọzọ sochiri ya ozugbo n'ahịa 'Monday Market' a ma ama dịka ndị nchekwa abụọ na mmadụ atọ bi na Maiduguri gwara ndị ntaakụkọ Reuters.

Ebe foto si, Reuters
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nahum Daso Kenneth kwuru na e zigala ndị nchekwa ebe ahụ ihe mere.
Ndịagha Naịjirịa na ozi ha bipụtara kwuru na ndịagha gbara mbọ megide mwakpo ndị otu na-eyi ọha egwu a na-enyo eyo bụ ndị otu Islamist wakporo na Maiduguri n'isi ụtụtụ Mọnde.





























