Onyeisiala Tinubu alaghachitela Naịjirịa dịka o mechara njem ọrụ na mba UK

Ebe foto si, Nigeria Television Authority
Onyeisiala Bola Tinubu na nwunye Oluremi Tinubu alaghachitela Naịjirịa dịka ha mere njem 'state visit' mbụ ha na mba UK.
Ụgbọelu Onyeisiala Tinubu dara n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja n'abalị Tọzde 19 Maachị, 2026 dịka njem ahụ bịara na njedebe.
Ọtụtụ ndịisi ọchịchị gụnyere Onyeisi ụlọomeiwu Sineti bụ Sinetọ Godswill Akpabio, Femi Gbajabiamila, Nuhu Ribdau na ọtụtụ ndị ọzọ jupụtara n'igwe iji nabata Onyeisiala Tinubu na nwunye ya.
Onyeisiala Tinubu ezutela Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer

Ebe foto si, Getty Images
Bola Ahmed Tinubu bụ Onyeisiala Naịjirịa gara njem nleta na Briten ezutela Praịm mịnịsta mba ahụ bụ Keir Starmer.
Bola Tinubu zutere Keir Starmer na obi ọchịchị mba Briten bụ 10 Downing Street dị na London na nkeji ole ma ole garaaga.
Cheta na njem a Onyeisiala Tinubu mere bụ nke mbụ Onyeisiala Naịjirịa na-eme ya kamgbe afọ iri atọ na asaa garaaga dịka Onyeisiala ikpeazụ mere ya na Naịjirịa bụ n'afọ 1999.
Naịjirịa, Briten yiri onwe ha n'ihe gbasara mmepe - Tinubu

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu ekwuola na Naịjirịa nọ n'ụzọ ịrọpụtara ụmụafọ ha mmepe dịka ọ dị na mba Briten.
Tinubu kwupụtara nke a n'obieze Windsor Castle na njem ọrụ ọ gara na mba United Kingdom site n'ọkpụkpọ oku Eze Charles nke atọ.
O toro mmekọrịta nọtere aka dị n'etiti Naịjirịa na mba United Kingdom, ma gosi obiụtọ na nkwanyeugwu e nyere ya dịka Onyeisiala Naịjirịa mbụ ga-ekwu okwu na Windsor kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ.
"Naịjirịa na UK nwere ebumnobi mmepe yiri onwe ha. Anyị na-ele anya ịkwalite mmekọrịta anyị site n'iji ebumnobi ndị anyị na-ekekọrịta," ka Tinubu kwuru.
Onyeisiala Naịjirịa kelekwara mba Briten maka ịrọpụtara ya ebe mgbazo, oge ha na-agbalị ihiwe ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa ihe karịrị afọ iri abụọ gara aga.
Ọ gbara ndị Naịjirịa bi na UK ume ka ha bụrụ ezigbo ụmụafọ site n'igosipụta ezi agwa, ma nwee olileanya na mmekọrịta dị n'etiti mba abụọ ahụ ga-adịgide.
Eze Charles ekeleela Onyeisiala Tinubu na njem ọrụ mbụ ya na mba Briten

Ebe foto si, PA Media
Eze Charles nke Briten na-ele Onyeisiala Naijiria bụ Bola Tinubu na nwunye ya bụ Remi Tinubu ọbịa na njem mbụ n'afọ 37 Onyeisiala Naijiria na-abịa njem ọrụ na mba Briten n'obieze 'Windsor Castle'.
Na mmalite njem abalị abụọ ahụ, Ezenwaanyị Camila, Nwaeze William na Adaeze Kate nke Wales nakwa ndị ọzọ welitere isi n'obi eze nabatara ndị ndu si Naịjirịa ma duga ha ịhụ Eze na Ezenwaanyị Briten.
Anyịnya igwe bụ Eze Charles nakwa Onyeisiala Tinubu batara n'ama ' Windsor Castle' bụ ebe ndịagha ti uwe zutere ha ma kụọ ukwe njirimara mba abụọ ahụ.
Tinubu na Eze Charles gara n'ihu nyochara ndịagha ahụ guzoro.

Ebe foto si, PA Media
A na-atụ anya na Tinubu ga-ekwu okwu na oriri ga-eme na mgbede Wenezde bụ nke ndị nwere agba na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa na ndị a na-anụ aha ha ga-abịa.

Ebe foto si, PA Media
Mana a gaghị enwe nri ehihie dịka Onyeisiala, onye bụ onye ụka Alakụba na-ebu ọnụ Ramadan.
Njem ahụ bụ iji kwalite mmekọrịta azụmahịa dị n'etiti mba abụọ ahụ.
Onyeisiala Tinubu awuchiela na Briten

Ebe foto si, Channels TV
Onyeisiala Bola Tinubu esila Abuja gawa mba United Kingdom ibido njem nke ụbọchị abụọ. Eze Charles III na nwunye ya Queen Camilla nabatara ha.
Tinubu na nwunye ya (Remi Tinubu) siri n'ọdụgbọelu Abuja pụta n'elekere 10:00 nke ụtụtụ ụbọchị Tuzde.
Ndị isi ala Naịjirịa kọwara njem a dị ka akụkọ ihe mere eme maka na ọ bụ onye isi ala Naịjirịa gara nleta steeti mbụ kemgbe 1989, na nke mbụ n'okpuru ọchịchị Eze Charles, na ọ bụkwa nke mbụ a ga-anabata ya na Windsor Castle.
Kedụ uru njem Tinubu na-aga na mba UK ga-abara ndị Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
A na-atụ anya na Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ga-aga mba 'United Kingdom' n'ụbọchị Tuzde 17 Maachị 2026.
Njem ahụ bụ maka nzukọ ga-adị n'etiti ya na ndị ndu mba Briten gbasara ịkwalite mmekọrịta ha na Naịjirịa n'ihe gbasara akụnaụba.
Njem ọrụ ya ga-amalite n'ụbọchị Wenezde 18 Maachị 2026, mgbe Tinubu na nwunye ya bụ Oluremi Tinubu ga-aga leta Eze Charles nke atọ na 'Windsor Castle'.
Tinubu ga-abụ onyeisiala Naịjirịa nke ise Eze mba Briten ga-anabata, ma bụrụkwa onye nke mbụ a ga-ele ọbịa na Windsor Castle, n'ihi na ọ bụ na Buckingham Palace ka a nọọrọ nabata ndị ndu Naịjirịa pụrụ apụ.
Nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nke onyeisiala n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Temitope Ajayi kwuru n'otu ozi o wepụtara, na njem ahụ ga-atụle uche na mmekọrịta dị n'etiti Naịjirịa na mba UK.
O nweela ndị ndu Naịjirịa a kpọrọla oku na mba UK n'oge gara aga?
Praịm Minista chịrị Naịjirịa oge mba ahụ nweere onwe ya bụ Abubakar Tafawa Belewa, bụ nwaafọ Naịjirịa mbụ mba Briten kpọrọ oku ọrụ, oge Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ nabatara ya n'ụbọchị 14 Disemba 1965.
Ha mechakwara nabata Onyeagha chịrị Naịjirịa mgbe gara aga bụ Yakubu Gowon n'ụbọchị 12 Juun 1973.
Onye ọzọ sochiri ya bụ Onyeisiala Shehu Shagari a nabatara na mba UK malite n'ụbọchị 17 Maachị ruo 20 Maachị, 1981.
N'afọ 1989, Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ nabatara Ọchịagha Ibrahim Babangida na nwunye ya bụ Maryam Babangida oge ha gara njem na mba ahụ.
Ihe Tinubu ga-eme ma ọ garuo mba UK

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ajayi kwuru na njem Tinubu na-egosipụta agba ọhụrụ n'ihe gbasara mmekọrịta mba Naịjirịa na United Kingdom, ọkachasị n'ihe gbasara azụmahịa, itinye ego nakwa mmepe.
Naịjirịa ka bụkwa mba nke abụọ ha na United Kingdom kachasị azụkọrịta ahịa na mba Afrịka, dịka e kwuru na ha na-azụkọrịta ahịa ruru ijeri pound asatọ kwa afọ, na ngalaba ikike, akụnaụba, agụmaakwụkwọ na nkanụzụ.
A kwalitere mmekọrịta akụnaụba n'etiti mba abụọ ahụ site na nkwekọrịta UK-Nigeria Enhanced Trade and Investment Partnership (ETIP) nke afọ 2024.
Ebumnobi nkwekọrịta ahụ bụ iji mụbaa ịzụkọrịta ahịa n'etiti mba abụọ ahụ, wezuga ihe mkpọbiụkwụ nke azụmaahịa ma kwalite mgbakọaka na ngalaba ọrụ ugbo, ikike nke a pụrụ inwogharị, teknụzụ nke ego, nrụpụta ihe nakwa imepụta nka.
Ajayi kwuru na njem Tinubu na-abịa n'oge Naịjirịa na-achụso mgbanwe ọnọdụ akụnaụba, nke ebumnobi ya bụ iji mee ka akụnaụba Naịjirịa guzosie ike, tinyere ịkpọbata ndị mba ọzọ na-etinye ego.
N'oge njem ahụ, a tụrụ anya na Tinubu na Praịm Minista mba Briten bụ Keir Starmer ga-akparịtaụka na Downing Street ma gaakwa ọgbakọ azụmahịa, nke ndị Naịjirịa na ndị Briten na-etinye ego ga-esonye.
Ọgbakọ ahụ ga-elekwasị anya n'ịkwalite mgbakọaka nke akụnaụba na ohere itinye ego na ngalaba ndị gụnyere igwupụta akụ ndị si na chi, ikike, ihe ndị e ji enyere ndụ aka, nkanụzụ nakwa ngalaba imepụta ihe ọhụrụ.
Ajayi kwuru na njem ahụ ga-aga n'ihu kwalite mmekọ dị n'etiti Naịjirịa na mba Briten site n'oge ochie ruo n'oge ugbua, nke ihe na-akpalite ya bụ azụmaahịa, itinye ego na ịkekọrịta akụnaụba.




























