Rev Uma Ukpai: Gọọmenti Abia Steeti amalitela ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ n'Umuahia

Foto akwamozu ụkọchukwu Uma Ukpai dịka mgbe gọọmenti Abia na-akwanyere ha ugwu ikpeazụ.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Gọọmenti Abia Steeti amalitela ịkwanyere ozu ụkọchukwu na onye mgbasaozi ọma a ma ama bụ Reverend Uma Ukpai ugwu nke ikpeazụ tupu e lie ya.

Nke a na-eme n'ama ezumezu Ochendo International Conference Center dị n'Umuahia bụ isiobodo Steeti ahụ n'ụbọchị Tọzde 26 Maachị, 2026.

Ọtụtụ ndị a ma ama na ndị ọnụ na-eru n'okwu na-agbakọta n'ama ezumezu ahụ, ndị a gụnyere ndị ụkọchukwu dị iche iche, ndị ndu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ebe a na-atụ anya na Gọvanọ Alex Otti na ndị ọrụ gọọmenti ọzọ ga-awuchi ebe ahụ.

A ga-eli ozu ụkọchukwu a n'ụbọchị Fraịde 27 Maachị n'obodo ya bụ Asaga dị n'okpuruọchị Ohafia nke Abia Steeti.

Ama ezumezu Ochendo International Conference Centre dị n'Umuahia, Abia Steeti.

Cheta na Reverend Uma UKpai nwụrụ n'ụbọchị isii nke ọnwa Ọktoba afọ 2025 dịka ọ rịachara obere ọrịa.

Nwamadị a bụ nwafọ obodo Asaga Ohafia dị n'Abia Steeti nwụrụ dị ka ọ gbachara afọ iri asatọ (80years).

Ndị ama ama gbakọtara n'ama ezumezu International Center iji kwanyere Uma Ukpai ukwu ikpeazu.
Ndị bịara n'ọgbakọ ịkwanyere Uma Ukpai ugwu ikpeazụ.

Ihe i kwesịrị ịma maka Uma Ukpai

  • Ọ bụ onye Asaga dị n'Ohafia, Abia Steeti, a murụ Uma Ukpai n'abalị asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ 1945.
  • Ọ bụ ya hiwere otu mgbasa oziọma a kpọrọ, 'Uma Ukpai Evangelistic Association (UUEA), bụ nke isiụlọọrụ ha dị n' Uyo, Akwa Ibom Steeti.
  • Ọ nọ n'isi na nhibere otu jikọro ndị ụka Kraisti agba ọhụrụ a kpọrọ "Pentecostal Fellowship of Nigeria', PFN bụ nke bụ mkpụrụ ọgbakọ oziọma o hiwere na Legọs n'afọ 1985 mịtara.
  • Ebe ndị ọzọ o hiwerela ọgbakọ ozioọma nke kpọtụrụ akpọtụ ma dọta igwe ndị mmadụ gụnyere; Ibadan n'afọ1982(Greater Ibadan for Christ) , Nsuka n'afọ 2012 wgz.
  • E wezuga ịdọtara Kraistị mkpuruobi, nke ọ na-eme site na ọgbakọ oziọma dị iche iche o merela, Ukpai bụ onye nleta ahụike ndị mmadụ na-aụ ọkụ n'obi.
  • Ọ bụ onyeicioche Uma Ukpai Eye Centre, nakwa ụlọgwụ 'King of Kings Hospital, dị N'Abia steeti
  • Ọ bụ ya hiwere ụlọakwụkwọ Uma Ukpai Polytechnic Asaga.
  • Ukpai bụkwa onye nwe Uma Ukpai School of Theology and Biblical Studies, dị n'Uyo,Akwaa-Ibom Steeti.
  • Onye ọrụ ebere, Ụkpai nwere ụlọọrụ o ji enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka 'Uma Ukpai Scholarship Foundation bụ nke o ji enye ohere agụmakwụkwọ n'efu.