Ndị uweojii Enugwu anwụchiela nkwaokoroọbịa dị afọ 24 maka ebubo idina nwaanyị dị ime n'ike

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii n'Enugwu Steeti anwụchiela nwaokoroọbịa dị afọ iri abụọ na anọ (24) aha ya bụ Desmond Ugwu maka idina nwaanyị dị ime n'ike, ma gbaakwa mbọ igbu ya.
N'ozi o wepụtara n'ụbọchị Sọnde 22 Maachị 2026, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru na nke a mere n'obodo Affa dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Udi n'Enugwu Steeti.
Nwaanyị ahụ dị afọ iri atọ (30) a na-akpọghị aha ya, si na nke onye agbataobi ya na-alọta n'abalị Satọde 14 Maachị 2026 n'otu okpo dị n'Amokwo-Affa tupu o zute nsogbu ahụ, ka ndị uweojii kwuru.
"Dịka ọ na-amaghị na o nwere onye na-eso ya, nwaokoroọbịa ahụ ji mma si n'azụ wakpoo ya na mberede. Ọ tụrụ nwaanyị ahụ n'ala, manye ya aka n'olu ma chọọ ịtọgbu ya, ma mechiekwa ya ọnụ iji gbochie ya ibe akwa".
"Ọ kpụbara ya n'ụlọ a ka na-arụ arụ ma yie egwu igbu ya ma ọ bụrụ na ọ jụ, tupu o dinaa ya n'ike ma merụọkwa ya ahụ," ka ozi ahụ kwuru.
Ndị uweojii kwuru na ha gbapụrụ ọsọ nwuchie nwaokoroọbịa ahụ a na-enyo enyo ozugbo ha nwetara mkpesa, ma kpọgaa nwaanyị ahụ e dinara n'ike ụlọọgwụ maka nnwale nakwa ọgwụgwọ.
Ha sịrị na mgbe ha nyochara mpaghara ahụ, ha chọtara ihe akaebe dị iche iche, ndị gụnyere mma e jiri mee nwaanyị ahụ mwakpo, tinyekwara uwe nke ọbara na mmiri nwa a na-enyo enyo na ha si n'ahụ nwaokoroọbịa ahụ dị na ya.
Ka ọ dị, Desmond Ugwu ekwupụtala na ọ bụ ya mere arụ ahụ, dịka Kọmịshọna ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Mamman Bitrus Giwa nyere ntuziaka ka e mee nnyocha miri emi.
Giwa kwekwara nkwa na a ga-eme ngwangwa kpụpụ nwaokorọbịa ahụ a na-enyo enyo n'ụlọikpe ozugbo ha mechara nnyocha.




























