N'Enugwu, ndị IMT majara onye ntaakụkọ BBC, ndị uweojii kpọchiri ya

Ebele Ekeopara

Ebe foto si, Ebele Ekeopara

Nkọwa foto, Ebere bụ onye ntaakụkọ BBC nọ n'Enugwu

Ndị ụlọakwụkwọ Institute of Management and Technology (IMT) dị n'Enugwu sogburu onye ọrụ ntaakụkọ BBC Ebere Ekeopara dịka ndị uweojii kpọchiri ya.

Ekeopara gara ime akụkọ gbasara mwepụ e wepụrụ ịkpa oke dị n'etiti asambodo nke mahadum politeknik bụ HND na nke ndị mahadum yunivasiti bụ B.sc oge onyeisi ngalaba "Business Administration and Management" bụ Syvester Onah jidere ya.

Onah kpọrọ Oliakụ Ekeopara onye aghụghọ na-ekwu ihe ọ bụghị tupu ọ kpọọ ndị nchekwa ụlọakwụkwọ ahụ ka ha nwụchie ya.

Ekeopara kwuru na mbọ niile ya gbara ịkọwara ha na ya na-arụ ọrụ ya dị ka mmiri a wụrụ n'okwute dịka ha kpagburu ya, mee ya akaja ma dọrọ ya gaa n'ụlọọrụ onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ.

Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ bụ Austine Nweze jụrụ ige ya ntị tupu ọ kpọọ onyeisi ndị nche n'ụlọakwụkwọ ahụ ka ọ kpọọ ndị uweojii.

Oge ndị uweojii bịara, ha kpọrọ Ebere pụọ, nara ya ekwentị ya, kpochie ya na ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogui rue ọtụtụ oge.

N'okwu Ekeopara, "Onah jidere m, kpọọ m onye na-eyi egwu na onye na-abụhgị onye m na-ekwu na m bụ. Ọ gbalịrị ịkpọ ụmụakwụkwọ ka ha tie m ihe. Dịka ha na-achọ ime ya, ha mebiri akụkụ ụgbọala m.

"Egosiri ụmụakwụkwọ akwụkwọ ọrụ m mana ha achọghị ige m ntị. Ndị nche mmadụ asaa nke Onah gwara ka ha mee m ihe kwagharịrị m aka, dọrọ m gaa n'ụlọọrụ ha ma gbalia iji ike nara m ekwentị m ọtụtụ oge.

Ugbọọla
Nkọwa foto, Ha mebiri ụgbọala Ebere

"Oge m ruru n'ụlọọrụ onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, akọwara m ya etu ndị ọrụ ya si mekpaa m ahụ n'ọnụ ụzọ mana ọ gwara onyeisi ndị nche ya bụ CSO n'aha ịchafụ ka ọ kpọọ ndị uweojii ka ha nwụchie m"

Oge Ekeopara ruru na nke ndị uweojii, ha jidere ya n'azụ kanta.

BBC kpọrọ ụlọọrụ onyeisi ndị uweojii na ndị isi ndị ọzọ ka ahapụ onye ntaakụkọ ha ozugbo.

Nke a mere kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Mohammed Danmallam jiri nye iwu ka a hapụ Ebere.

Tupu a hapụ ya, onye uweojii nọ n'ụlọọrụ ha mere ya n'ike ka ọ banye aka n'akwụkwọ nhapụ ego puku naịra 150.

Ihe ndị uweojii kwuru maka ihe a

Oge BBC kpọrọ onye na-ahụ maka ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogui bụ Arthur Amobi, o kwuru, "Agaghị m aza gị ma yabụrụ na ịbịaghị n'ụlọọrụ m."

Mana onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ebere Amarizu kwuru na a nwụchiri Ekeopara maka na e che na ọ bụghị onye ntaakụkọ n'ezie.

"Agwara m maka nwuchi Ebere mana ndị uweojii chọrọ ịmata ma ọ bụ onye ntaakụkọ n'ezie."

Na nkezi afọ ole a na-atụanya mmadụ ga-adị ndụ site n'ọmụmụ bụ 72 - ya bụ 70 nke nwoke na 75 nke nwaanyị. Mana, nke a na-agbanwe kwa ka ndụ na-aga. Iji maatụ, onye dị afọ 69 ga-atụ anya ibikwa afọ 17 ọzọ.

N'ihe gbasara ego e kwuru na ọ ga-akwụ, Amarizu kwuru na ọ bụ iwu na onye ọbụla ndị uweojii na-ahapụ ga-abanye aka ịkwụ ego ka ha ghara ịgba ọsọ.

Onye nkwuchiteọnụ ụlọakwụkwọ IMT bụ Ifeanyi Ojobor gwara BBC na ya amaghị ihe ọbụla gbasara ihe ahụ mere.

Oge BBC kpọrọ onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, o kwuru na onye ntakụkọ ahụ kwesiri ịnata ikike n'aka ndị ụlọakwụkwọ ahụ tupu o mee ihe ọbụla ebe ahụ.

N'okwu ya, "Ọ nọ na-agba ndị mmadụ ajụjụọnụ na-anataghị ikike. Agwala m ndị uweojii ka ha wepu ikpe ahụ."

Presentational grey line

Akụkọ ga-amasị gị:

Presentational grey line

Vidio

  • Mohamed Salah na Michael Ilediagu
  • Ihe Obi Cubana kwuru maka ọchịchị Onyeisiala Tinubu
  • Ana m eji nsị na ureghure emepụta gaasị e ji esi nri - Ikechukwu Obioma
  • Ndị okpukperechi Islam bi n'Aba mere emume Sallah
  • Ndị Omeiwu ochie
  • Foto mmanụ nri a na-ere n'ahịa
  • Onye ọkụ gbara ngwaahịa ya n'Onitsha Headbridge
  • "Taa mụ na gị nọ, ana m akwado onye na-achị anyị bụ Ahmed Bola Tinubu."
  • Etu ọkụ si mebie ọtụtụ ngwaahịa ndị mmadụ n'ụlọahịa dị n'Anambra steeti
  • "Ihe a bụ 'smart car', ụmụaka na-ede 'program' n'ime ya. Ya na ụmụaka na-akparịta ụka. Ha sị ya bịa, ọ bịa".
  • Ihe Gọvanọ Borno Steeti kwuru maka ogbunigwe atọ gbara na steeti ya
  • "Anaghị m ekpu okpu mmeemmee iji metọọ omenala, kama ana m ekpu ya n'ihi na nke a bụ naanị omenala m maara ma bụrụkwa naanị omenala m na-asọpụrụ."
  • Gịnị mere Ọkaikpe jiri gwa Ọkaiwu Sowore ka o sekpuru ala n'ime ụlọikpe?
  • Agaghị m echeta onye osikapa 'jollof' nke ya kachasị ụtọ - Eze Charles III
  • Ihe Minista Mgbasaozi kwuru maka njem Onyeisiala Tinubu na mba UK
  • Oge e bunyere ndị Senịgal iko AFCON 2025
  • Cosmas Maduka bụ onye oji ego achụ nta ego a ma ama na Naịjirịa nwee ụlọọrụ Coscharis e ji ịzụ ahịa ụgbọala mara.
  • Onyeisiala Bola Tinubu
  • Ebe ndị City Boy Movement mere ihe n'Imo steeti.
  • Ihe na-eme ugbua na Borno steeti

Akụkọ akachasị gụọ

Trending Now