Ndị ahịa akọwaala ihe kpatara ọkụ ọgbụgba n'ahịa Head Bridge Ọnịcha

Ebe ọkụ gbara n'ime ahịa 'Bridge Head Market' Ọnịcha
Nkọwa foto, Ebe ọkụ gbara n'ime ahịa 'Bridge Head Market' Ọnịcha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Aha onyonyo, "Ngwaaghịa m gbara ọkụ n'Onitsha Headbridge karịrị nde naịra iri abụọ na ise"

Ụfọdụ ndị ahịa ekwuola na ọ bụghị nsogbu ọkụ latrik kpatara ọkụ gbara n'ahịa 'Bridge Head' dị n'Ọnịcha n'Anambra Steeti.

Ha kwuru na ọkụ ọgbụgba ahụ metụtara ihe rụrụ ọnụụlọ ahịa iri na abụọ n'ime ahịa ahụ.

Dịka ụfọdụ ndị ahịa si kwuo, a na-agbanyụ ebe ọkụ latrik si abata n'ime ahịa ahụ ma o jiri ọkara gaa elekere anọ nke mgbede.

Ha kwuru na ọkụ latrik adịghị n'ụbọchị ihe a mere nke pụtara na ọ bụghị nsogbu ọkụ latrik kpatara ya.

Ihe ndị ọkụ lara n'iyi gụnyere: pịpụ, akpụkpọ ụkwụ nakwa sịramik.

Aha onyonyo, Etu ọkụ si mebie ngwaahịa ndị mmadụ na Head Bridge Ọnịcha

Ọkụ agbariela mpaghara ahịa 'Bridge Head Market' Ọnịcha

Ndị mmadụ na-akpakọlata akụrụngwa eji arụ ọrụ mmiri
Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-akpakọlata akụrụngwa eji arụ ọrụ mmiri

Ọkụ tiwapụrụ n'ime abalị agbariela mpaghara ebe a na-ere akụrụngwa e ji arụ ọrụ mmiri n'ahịa 'Bridge Head' Ọnịcha dị n'Anambra Steeti.

Ọkụ ọgbụgba ahụ lara ọtụtụ ngwaahịa n'ihi ma bute ọnọdụ amaghị nke a ga-eme n'ahịa ahụ na-ekwo ekwo.

Akụkọ kwuru na ahịa ahụ dị n'okporoụzọ si Ọnịcha gawa Ọka baara ọkụ n'ụbọchị Fraịde abalị iri abụọ nke ọnwa Maachị afọ 2026 ma regide ọkụ ruo n'ụtụtụ Satọde abalị ịrị abụọ na otu nke ọnwa Maachị 2026.

Ahụrụ ọkụ si n'otu n'ime ụlọahịa ebe ọkụ gbara na-apụta
Nkọwa foto, Ahụrụ ọkụ si n'otu n'ime ụlọahịa ebe ọkụ gbara na-apụta

Ndị hụrụ oge o mere kwuru na ọkụ ahụ malitere mgbe ọ fọdụrụ ihe dịka nkeji ise ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị, ma jiri ọsịịsọ fesaa na mpaghara dị iche iche tupu a kwụsị ya, nke mere o jiri raa ndị mmadụ ahụ ibupụ ngwaahịa ha.

Mbọ niile ndịahịa gbara iji nweeike bupụta ngwaahịa ha kụrụ afọ n'ala n'ihi etu ọkụ ahụ si agbasi ike.

Ka ọ dị, Onyeisi okpuru ọchịchị ime obodo Ọnịcha Saụt bụ Emeka Orji kpọtara ndị mgbanyụọkụ n'ahịa ahụ, nke mere e ji nweeike gbanyụọ ọkụ ahụ.

Ahụrụ ọkụ si n'otu n'ime ụlọahịa ebe ọkụ gbara na-apụta
Nkọwa foto, ụfọdụ akụrụngwa ndị mmadụ rere ọkụ n'ụlọahịa ọkụ gbara