Lee iwu mba Senịgal dara CAF jiri kpebie ịnapụ ha iko AFCON 2025

Mgbe ndị Senịgal buru iko AFCON 2025 na mba Moroko.

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ngalaba mkpeghari ikpe nke otu bọọlụ jịkọtara mba Afrịka bụ Confederation of African Football (CAF) ekwuola na ọ bụ mba Moroko meriri n'asọmpị African Cup of Nations (AFCON) 2025.

Ngalaba ahụ bụ nke na-ahụ maka ikpe asọmpị nakwa egwuregwu bọọlụ mere ka a mata nke a ma kwuo na ha gbadoro ụkwụ n'iwu ha nke iri asatọ na anọ ('Article 84').

CAF kpebiri na mba Moroko ji ọkpụ atọ merie mba Senịgal ma bunye mba Moroko iko AFCON 2025.

Cheta na Senịgal ji otu ọkpụ goolu nke a saghị asa merie Moroko n'asọmpi ikpeazụ nke Jenụwarị 2026 mana otu egwuregwu Confederation of African Football (Caf) kagburu mpụtara ahụ n'ụbọchị Tuzde 17 Maachị 2026 n'ihi na ndị otu egwuregwu Senịgal si n'ama egwuregwu pụọ n'iwe mgbe e nyere ndị Moroko asụwaagbaa n'oge nkwụsị.

Ndị otu egwuregwu Senịgal lọghachitere mgbe nkeji iri na asaa gachara, mana ochie goolu ndị Senịgal nwụchiri asụwagbaa ahụ tupu otu ọ gbaa bọọlụ bụ Pape Gueye nke Senịgal nwere nye goolu mmeri n'oge mgbakwunye.

Ka a gbachara bọọlụ ahụ, ndị Moroko nyere mkpasa na ngalaba mpegharịkpe nke otu CAF.

Ọ bụ etu a ka okwu si dagharịa dịka otu CAF nyere mkpebi na Senịgal dara iwu abụọ, ma napụ ha iko AFCON 2025 were nye ha ntaramaahụhụ ndị ọzọ.

Lee mkpebi ngalaba mkpegharị ikpe CAF nyere

Ngalaba CAF na-ekpe ikpe banyere maka ihe mere n'asọmpi nyere ọtụtụ mkpebi ma nye ndị Senịgal ntaramaahụhụ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

CAF kwuru na ha nwere ike ịnabata mkpesa otu egwu bọọlụ mba Moroko bụ Fédération Royale Marocaine de Football (FRMF) wetere ma kwuo na ọ dị ire.

CAF kagburu ma wezuga mkpebi ngalaba ha na-ahụ maka etu ndị na-agba bọọlụ si akpa agwa dịka ha kwuru na mba Senịgal dara iwu abụọ.

Iwu nke mbụ Senịgal dara dị na ngalaba iri asatọ na abụọ maọbụ 'Article 82' n'olu bekee kwuru na a ga-enye ndị ọbụla ji aka ha kwụsị ịgba bọọlụ maọbụ sị na ha adịghịzị agba bọọlụ ntaramahụhụ.

Nke abụọ bụ ngalaba iwu iri asatọ na anọ, ya bụ 'Article 84' kwuru na ndị dara iwu dị na Article 82 ga-abụ ndị e jiri ọkpụ goolu atọ merie.

O kwukwara na a ga-enyekwa ọtụtụ ndị ọgba bọọlụ ahụ dara iwu ahụ nakwa ndị nkụzi ha ntaramaahụhụ.

CAF manyere na Moroko gbara Senịgal ọkpụ atọ a na-asataghị otu dịka iwu ahụ si kwuo.

N'agbanyeghị mba Senịgal ekwuola na ha ga-ewepụ okwu a n'ụlọikpe kachasị n'ụwa niile bụ nke na-ekpe ikpe banyere asọmpị bọọlụ, mana ọ bụrụ na mkpebi CAF guzoro bụrụ nke pụtara ihe, mara na mba Moroko ga-abụ ndị nwetara nturuugo AFCON 2025 n'ihe ruru ọnwa abụọ ka a gbachara asompi ahụ.

Gọọmenti Senịgal eboola otu CAF ebubo nrụrụaka maka iko AFCON

Gọọmenti Senegal eboola otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mba Afrịka bụ AFCON ebubo nrụrụaka maka mkpebi ya ịnapụ Senegal iko mba Afrịka nke afọ 2025 ma nye ya Moroko.

Ha gara n'ihu kpọọ oku ka e mee "nnyocha nọọrọ onwe ya" gbasara "ihe a na-enyo enyo dịka arụrụala" n'otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ iko mba Afrịka nke afọ 2025.

Ha kwuru na "Senegal jụrụ n'ụzọ doro anya mgbalị a na-ezighị ezi iji napụ ya meeli."

N'okwu gọọmenti Senịgal wepụatara ka o kwuru na "mkpebi a na-ahụtụbeghị mbụ ma dịkwa oke njọ" dabere na "nkọwa ezighi ezi e nyere iwu otu ahụ, nke butere nnukwu mkpebi n'ụzọ iwu na-akwadoghị na nke na-ezighị ezi".