Ịran ọ ga-emerinwu mba Amerịka?

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, Mojtaba, na Praịm Minista mba Izrel bụ Benjamin Netanyahu

Ebe foto si, Reuters/Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ebumnobi Amerịka na Onyeisiala Donald Trump n'agha a edoghị anya. Mana okwu ngwaagha nuklia nakwa ịchụtu ọchịchị Ịran bụ ihe a ma.

Mana na-agbanyeghị na e gbuola onye ndu Ịran, onye ọzọ anọchiela ya, o nweghị onye gere oku Onyeisiala Donald Trump na Benjamin Netanyahu kpọrọ ndị Ịran ka ha kwatuo ọchịchị, kama ndị ọkachamara kwuru na agha ahụ jikọtara ndị Ịran.

Dịka Amerịka na Izrel na-aga n'ihu ibu agha megide Ịran, o nweghị ngụkọ gosiri onye na-emeri n'ọgụ ahụ malitere n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febụwarị 2026.

Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuola ugboro ugboro na ya ebiela okwu ya na ndị Ịran, dịka ya bibiri ndịagha mmiri ha nakwa agha ụgbọelu na ihe ndị ọzọ.

Mana nkwechiri Ịran kwechiri nakwa mwakpo ha gara n'ihu na-awakpo ọkachasị ogige agha ndị Amerịka nwegara na mba ndị dị na mpaghara Middle East, na-arụtụ aka n'ihe ka na-abịa n'ụzọ.

Trump kwuru na nke Ịran agwụla, na ihe fọrọ bụ ịzapụ ụkwụ ha, dịka o kwuru na Ịran na-arịọzị ka a kpaa udo.

Mana ndị ndu Ịran agọọla na o nweghị mgbe ha rịọrọ ka e bie agha ahụ kama na ha ga-alụ ọgụ ahụ rue na njedebe.

Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images

Trump kwuru sị, "E memilala ike agha ụgbọelu ha, nke agha ụgbọmmiri nakwa nke ndị ndu ha."

Ọ gara n'ihu sị, " Ha chọrọ ka a kpaa. Mana agwara m ha n'oge agwụla."

Mana n'ọsịsa ha , Ịran kwuru na ha na-azọ onwe ha site na ịwakpo Izrel nakwa mba ndị dị na 'Middle East' ebe Amerịka nwere ogige ndịagha.

Gịnị ka Amerịka na-achọ?

Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ebumnobi Amerịka na Onyeisiala Donald Trump n'agha a edoghị anya. Mana okwu ngwaagha nuklia nakwa ịchụtu ọchịchị Iran bụ ihe a ma.

Mana na-agbanyeghị na e gbuola onye ndu Iran, onye ọzọ anọchiela ya , o nweghị onye gere oku Donald Trump na Benjamin Netanyahu kpọrọ ndị Iran ka ha kwatuo ọchịchị, kama ndị ọkacha mara kwuru na agha ahụ jikọtara ndị Iran.

Tupu agha ahụ amalite, Amerịka na Ịran nwere mkparịtaụka udo na Geneva n'ọnwa Febụwarị nke Oman nyere aka na ya ebe e nwere obere ọganihu.

Oman kwuru na Ịran kwetaburu ịkwụsi nkwalite na mmepụta ngwagha nuklia mana ha ekwetaghị ịkwụsị mmepụta ogbunigwe maọbụ nkwụsị ịkwado ndịagha nnupụisi dịka Houthis, Yemen, Hezbollah na Lebanon.

Mana ọ dịka ihe bụ isi ihe Amerịka chọrọ bụ iwepụ Ọchịchị Ayatollah ,tiye ndị anaghị agba isi akwara bụ ndịagaghị enye Amerịka na ndị agbataobi ha nsogbu.

Ihe Amerịka chọrọ ime bụ ka ike gwụ Ịran ka ha chilie aka elu mana nke ahụ ga-esi ike dịka Ịran gbara isi akwara ka na-akpa ike.

Mkpọchị Ịran kpọchiri 'Strait of Hormuz' etinyela mbaụwa na nsogbu ụkọ mmanụ agbịdị nke pụtara na Amerịka ga-eme ihe abụla iji mepee ya mana ha na-arịọ nkwado mba ndị ọzọ.

Gịnị ka Izrel na-achọ?

Benjamin Netanyahu

Ebe foto si, Getty Images

Izrel chọrọ ka ebibie ogbunigwe Ịran ma kposaa ogige ndịagha ha dị na mba ndị ọzọ.

Mana e bibie ụlọọrụ, e nwere ohere ịrụgharị ya.

Mana Izrel chọrọ ka ebibie ya, ọbụladị ma ọ bụrụ na ha ga-arụ ya n'oge eteghị aka.

Izrel na-ahụta ogbunigwe Ịran na mbọ ha ịrụ ngwaghaị nuklia dịka nnukwu ihe mmaja.

Ịran nwere ụlọọrụ na-emepụta 'droonu' ma na-ebunyekwa mba Rọshịa 'droonu ha ji alụ ọgu megide Yukren.

Ịran enwetala ihe ọnatara chi 'Uranium' karịrị pasent 60 bụ nke gafere 'ụranium' e ji emepụta ọkụ eji arụ ọrụ maọbụ akwọ ụgbọala

Mana Qaddam kwuru na Izrel agafeela n'ebe Amerịka, na-ekwu na ihe ha chọrọ n'aka Ịran bụ ịkwatu kpamkpam ọchịchị mba Ịran.

Gịnị bụ ebumnobi Ịran?

Ebumnobi Ịran bụ ịhụ na ha emeghị ihe Amerịka na Izrel na-ele anya ya tupu agha ahụ ebie.

Qaddam kwuru na ọ bụrụ na agha ahụ ebie, ma Amerịka na Izrel enwetaghị ihe ha chọrọ, ndị Ịran ga-ekwu na mmeri bụ nke ha site n'agha ha lụrụ.

Ịran ga-achọkwa nkwekọrịta na agahị ebuso ha agha ọzọ n'ọdịnihu.

Ugbua, agha ahụ abala n'akụnaụba, dịka Ịran mechiri ọwa mmiri Hormuz.

Iran ọ ga-emerinwu?

Mojtaba Khamenei

Ebe foto si, EPA

Ma Ịran ọ ga-emerinwu, Mohammad Qaddam Siddiq Isa, onye bụ onye okwu Middle East doro anya kwuru na ihe a ga-akpọ mmeri ga-agbado ụkwụ n'ihe akụkọ ọbụla na ọgụ ga-ahụta dịka mmeri.

Siddiq,"Ihe Ịran ga-ahụ dịka mmeri bụ agha ahụ ibi ma Amerịka na Izrel enwetanwu ihe ha na-achọ."

Mana dịka Trump na-ekwu na o nwetala mmeri, ọ na-arịọ enyemaka mba ndị ọzọ nọ na Yurop, otu 'United Nations' na ndị ọzọ ọkachasị dịka o siri metụta imepe ọwa mmiri 'Strait of Hormuz'

" Ya mere na ụfọdụ ndị mmadụ ji ahụ akụkụ dị iche iche n'ọgụ ahụ dịka onye ọbụla n'ime ha ji okwu ịgharamigha na-egosi na ha na-emeri, nke mere ka o sie ike ịmata onye na-emeri.

Mana ụfọdụ na-ahụ mwakpo Ịran na-eme, mmechi ha mechiri ọwammiri 'Strait of Hormuz',nakwa azụmahịa mmanụ agbịdị na mba ụwa dịka ike Ịran na-akpa n'agha ahụ.

Ọzọ bụ na Ịran bụ mba lụrụla ọgụ nnupụisi bido na mgbe ochie, ha nwekwara ogige ndịagha kachasị na Middle East.

Ozi nke ụlọọrụ ' Center for International Studies on Military Power kwuru n'afọ 2025 na Ịran nwere ndịagha ruru 610,000, gụnyere 350,000 bụ ndị na-arụ ọrụ dịka ndịagha ala ha, ebe190,000 n'ime ha bụ ndịagha pụrụ iche a kpọrọ 'Revolutionary Guard' bụ ndị ọrụ ha bụ imepụta igwe 'droonu' na ogbunigwe nakwa ihe ndị ọzọ.

Ịran nwekwara mba ndị nọ ha okirikiri na-akwado ha dịka ndịagha nnupụisi Houthi nọ na Yemen, Hezbollah nọ na Lebanon, ndị Hamas nakwa ndịagha nnupụisi nọ n'Ịraq na Hamas.

Nicole Grajewski kwuru na agbanyeghị ntaramahụhụ enyerela Ịran na ha ediela ọgụ na mgba ogologo oge.

Oge Ịran na Ịrak lụrụ agha, a wakporo ọtụtụ obodo mepere emepe na Ịran n'agbanyeghị na ha enweghị ngwaọgụ ọgbara ọhụrụ.